Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Karl Barth (Switzerland, 1886-1968)
Mgbe anyị na-ekwu maka amara, anyị na-eche maka eziokwu ahụ bụ na ihu ọma [Chineke] n'ebe ihe e kere eke adịghị ekwe ka a wuo ya n'ala ma ọ bụ mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ site na nguzogide nke yabụ ihe e kere eke. Mgbe anyị na-ekwu maka ịdị nsọ, anyị na-eche, n'aka nke ọzọ, maka eziokwu ahụ bụ na ihu ọma Ya n'emeri ma n'ebibi nguzogide a.
Ikwu maka amara bụ ikwu maka mgbaghara mmehie; ikwu maka ịdị nsọ, bụ ikwu maka ikpé mmehie ikpe. Mana ebe ọ bụ na ha abụọ na-egosipụta ịhụnanya nke Chineke, kedụ otú a ga-esi enwe otu wee hapụ ibe ya, mgbaghara ma hapụ ekpemikpé ma ọ bụ ekpemikpé enweghị mgbaghara?
Naanị ebe a n'ekpughebeghị ịhụnanya Chineke, ebe akabeghị kwenye n'ịhụnanya Chineke ma ọ bụ ebe a kwụsịrị ikwenye n'ịhụnanya Chineke, ka a pụrụ inwe nkewapụ kama ndịiche, na ha abụọ. N'ebe a, a pụrụ ikwu maka mgbaghara hapụ ikpo mmehie aha, ma n'ekwu maka ikpe-ikpe ma hapụ ikwu gbasara ọmụma-ikpe. Ikwu otù ahụ agaghị abụ ikpe Chineke na nke mbụ ma ọ bụ mgbaghara Chineke na nke abụọ.
Ọbụrụ na anyị na-ekwu okwu n’okwukwe, ma n'eziokwu nke ìhè Chineke na ịhụnanya Ya, ma n'eziokwu nke mgbaghara na ekpemikpe nke Chineke, ka nghọta-ime anyị n'eto, anyị ga-amata ndịiche dị n'etiti amara Chineke na ịdị nsọ Ya, mana anyị agaghị ekewa ha ma ọ bụ si n'otu wepụ ibe ya.
Njikọ́ dị n'etiti ha abụọ bụ nke a n'achịkọta nke ọma n'eziokwu bụ na, ha abụọ na-ekwupụta ma na-egosipụta ịhụnanya Chineke ma Ya-Onwe-Ya na omume Ya n'ime ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Dinwenụ nke ọgbụgba ndụ dị n'etiti Ya-Onwe-Ya na ihe O kere eke.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056