Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 22 NKE 46

Chineke Dị́ Nsọ́ (Keith Potter)

N’oge Lentị anyị na-echeta nnukwu àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ, mgbaghara ahụ e ji ndụ Ya wee kwụọ. Anyị na-ekwupụta na mmehie anyị ekewaala ụzọ nke mmekọrịta anyị na Chineke.

Otu o sila dị, nkwupụta anyị agaghị aba uru ma dị ka nke na-abụghị eziokwu ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị etu Chineke siri dị ukwuu na dị nsọ. Anyị na-eledakarị ịdị njọ nke mmehie na mmetụta n'egbu egbu ọ n'eweta, anya, nke n'eme ka anyị ghara ịdị ka Chineke na ịdị nkwesị ka anyị na Ya n'enwe mmekọrịta mara mma. Mbọ anyị na-agba ịgbaghara onwe anyị na ndị ọzọ agaghị aba uru ma ọ bụ bụrụ nke eziokwu ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ka amara Chineke siri wee kpuchie anyị kpamkpam site na Jizọs Kraịst, n'eme ka anyị bụrụ ndị ezi omume n'anya Chineke na ndị kwesịrị ekwesị maka mkpakọrịta ọma Ya.

Ya mere n’oge nke a, anyị na-atụgharị uche n’ịdị nsọ nke Chineke ma n'eche ihe ọ ga-adị kà ijupụta nanị n’ebumnobi ịhụnanya na ezi mkpali, dị ka Chineke anyị.

N’Aịzaya 6, anyị chọpụtara na akụkọ banyere onye amụma ukwu ahụ malitere site n’ọhụụ dị ebube o nwere nke Chineke nọ n’ocheeze Ya, ndị mmụọ ozi ewee gbaa Ya gburugburu. Ehihie na abalị, ndị a n'eje ozi n'eti mkpu, sị, "Nsọ, nsọ, nsọ ka ONYE-NWE-NU Usù Ndị Agha Niile Nke Eluigwe dị! Ụwa nile jupụtara n'ebube Ya!" (Aịzaya 6:3). Azịza Aịzaya ewee bụrụ gịnị? "Nke m agwụla! Alaa m n'iyi, n'ihi na m bụ nwoke mmehie. A bụ m onye ọnụ ya jupụtara na njọ, m wee birikwa n'etiti ndị n'ekwu ihe rúrú unyi. Ma n'agbanyeghị nke a, ahụwo m Eze Eluigwe, bụ Ya n'achi Usù Ndị Agha Niile Nke Eluigwe.” (Aịzaya 6:5)

Ịhụ Chineke nyere Aịzaya anya ịhụ onwe ya. Adịghị ọcha. Jupụtara n'unyi nke gbara ya gburugburu. Dị ihe niile na-abụghị nsọ. Ya mere Chineke jiri metụ Aịzaya aka. Aịzaya ewee nata mgbaghara na nsachapụ unyi ya niile na njikere ọhụrụ ime ihe. Chineke chọrọ mmadụ ga-ejere Ya ozi. Aịzaya zara, si, "Onye-nwe-anyị, m ga-aga! Zipụ m."

Nke ahụ pụrụ ịbụ akụkọ anyị. N'ìhè nke ịdị nsọ nke Chineke, unyi anyị niile zoro ezo n'agba ka anyanwụ. "Chei, ụwa m o! Abụ m onye rúrú unyi bi na etiti ndị rúrú unyi. Ugbu a m na-ahụ Gị n'ezie, Onye-nwe-anyị, m na-ahụ onwe m. Nyere m aka!" Ma Chineke n'enye aka, jiri amara dị ukwuu karịa mmehie anyị. Ọ bụrụ na ịdị nsọ Ya dị ukwuu, amara Ya karịrị akarị, n'ihi na ọ na-ekpuchi mmehie anyị niile nke ga-akpasu ịdị ọcha nke ịdị nsọ Ya iwe. “Bịanụ, ka anyị kọọ banyere ịdị ukwuu nke Onye-nwe-anyị, ka anyị niile bulie aha Ya elu” (Abụ Ọma 34:3).

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara