Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 20 NKE 46

Ị́dị Nsọ na Amara nke Chineke

Mgbe ụfọdụ ọ na-esiri anyị ike ịghọta nke ọma ihe ịdị nsọ pụtara. Anyị dị ezigbo anya n'ebe Ụlọ Òfùfè Chineke ahụ nọ, nke nyere nkọwa doro anya maka ịdị nsọ nke Chineke. Anyị enweghị vidiyo ọbụla e debere maka Mgbanwe Ahụ Mere Kraịst N'elu Ugwu, bụ́ ebe Jizọs kpughere Onwe Ya nye ndị ụmụ-azu Ya kachasị dị Ya nso. Anyị enweghị ihe ngosipụta a hụrụ anya nke ịdị nsọ.

N'agbanyeghị nke a, ọ̀ gà-ekwe omume na, dịka ndị-nsọ bú anyị ụzọ, anyị pụrụ inwe ahụmahụ nke ịdị nsọ? Ma eleghị anya, karịa ka anyị ghọtara ma ọ bụ nwee mmasị ịnakwere, ịdị nsọ nke Chineke dị gburugburu anyị. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ihe ọ pụtara nwere ike ịdị ukwuu.

Ọ buru na ịdị nsọ abụghịzi kwa otu ebe n'ime Ụlọ Òfùfè Chineke ma ọ bụ igbe-ndụ dị nsọ, gịnịzi bụ ịdị nsọ? Ebee ka ịdị nsọ dị? Ma onyekwanu dị nsọ?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara