Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 16 NKE 46

Dabere Na M (Karen Sloan)

"Dabere na M." Chineke na-akpọ mụ na gị òkù a n'oge ọ bụla nke ndụ anyị. Anyị nwere ike ịhọrọ ịza, "Biko, Chineke, napụta m! Bịa ọsọ ọsọ, Onye-nwe-m, nyere m aka." Ma nye onwe m, ihe m na-elekwasịkarị anya bụ n’onwe m. Obi m na-arapara n'ihe niile m mmezuru ma ọ bụ n'ihe niile m na-aruzubeghị. Ekwenyere m na ọnọdụ niile m n'ahụ onwe m na ya bụ n'ihi ikike nke m ma ọ bụ n'ihi adịghị-ike nke m. Mgbe ndụ bụ maka ihe niile gbasara m, ọ na-eme ka m kpuo-ìsì pụọ n'eziokwu nke ịdabere kpam-kpam n'ebe Onye-Okike m nọ. Mkpọtụ nke mpako na nchegbu na-egbochi òkù ịbịa dabere na ogwe-aka ebighị-ebi nke Onye-nwe-anyị.

Chineke kere anyị ka anyị dị ndabere. Ọ bụ ndabere n'akụkụ abụọ - nke mbụ, ndabere kpọmkwem n'ebe Chineke nọ, na nke abụọ, ndabere n'ụzọ n'adịghị kpọmkwem na Chineke site n'aka ndị ahụ Chineke na-eweta na ndụ anyị. Ịdị-adị anyị kwesịrị ibụ nke njikọ mmadụ na ibe ya, a bụghị nke nkewapụ-iche.

Dịka Jizọs biri ndu Ya n'elu ụwa a dika Chineke na dịka mmadu, O biri ndu kachasị ndu nke ịdabere na Nna Ya mgbe nile; n'agbanyeghị nke ahụ, Ọ daberelekwa ná ndokwa Nna Ya sitere n'aka ụmụ mmadụ ndị ọzọ. Chineke si n’aka Meri nye ndụ mmadụ Jizọs ndokwa. Meri bu ụzọ buru Jizọs n’ime ahụ́ ya n'afọ ime ma buruzie Ya n’aka ka nwa. Ihe oriri Meri nwetara ka ọ dị ime Ya bụ nri mbụ O nwetara. Meri nyere Ya nri kwa ụbọchị wee jiri obi ya niile lebara Ya anya dịka nne - n'emejupụta otu n'ime mkpa kachasị dị omimi nke mkpụrụ obi mmadụ.

Mgbe Jizọs tolitere, Ọ daberela n’ọtụtụ ndị obodo Ọ nọ n'ime ya ka Ọ rụzuo ọrụ ahụ a kpọrọ Ya ka Ọ rụọ. Otu nwa okorobịa nyere ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ ga-egbo agụụ puku mmadụ ise. Jizọs rịọrọ otu nwanyị nọ n'akuku otu olulu-mmiri, mmiri ọṅụṅụ - ma dabere n'okwu ya izisa ozi ọma obodo ya dum bụ nke ndị Sameria, na-eduga ọtụtụ ndị mmadụ ikwere na Ya. Ka ibu iru újú riri Ya ahụ n’ogige Getsemani, Jizọs chọrọ ngụgụ-obi n’aka Pita, Jemes, na Jọn, ọbụna na ha dara n’ụra kpọmkwem mgbe Onye-nwe-anyị kacha chọọ ọnụnọ ha. Mgbe Jizọs nwụrụ n'obe, Meri na ndị inyom ndị ọzọ na Jọn nọ n'ebe ahụ, ikekwe na-adị njikere igugu ozu Ya nwa ikpeazụ tupu e buru Ya gaa ili. Jizọs kpọkuru onye na-eso ụzọ Ya ka o meere Ya otu ihe ọzọ - ilekọta nne Ya (Jọn 19:26–27). Ọbụna ili Ya bụ onyinye sitere n’aka otu n’ime ndị na-eso ụzọ Ya (Matiu 27:59–60).

Ma Jizọs anọghị n'ili a gabiga ụbọchị atọ. N’ihi na Onye ahụ Ọ tụkwasịrị obi tupu ndị ọzọ niile, kpọlitere ​​Ya n’ọnwụ baa ná ndụ.

Enwere nnwere-onwe n'ịdị ndabere. Ọ na-enyere onye ọ bụla n'ime anyị aka ịnakwere adịghị ike anyị. Anyị agaghịzi ezo n'ihere ma ọ bụ chọọ ọdịmma anyị site n'ike nke aka anyị. Mụ na gị nwere ike ịhọrọ ịdabere n'ebe Nna-anyị Chineke nọ n'etiti oke ọdachi na n'ime ihe niile mara mma anyị na-agabiga, na-ekpe ekpere si, "Biko, Chineke, napụta m! Bịa ọsọ ọsọ, Onye-nwe m, nyere m aka" (Abụ Ọma 70:1).

Anyị dabere na Onye-nwe-anyị, anyị adaberekwa na ndị kacha anyị nso, ka dabere na ndị-nsọ bụ ndị buru anyị ụzọ n’okwukwe. Narị afọ iri na isii gara aga, otu onye ndú Ndị Kraịst nke Europe aha ya bụ John Cassian bipụtara akụkọ banyere mkparịta ụka ya na ndị mọnkụ bi n’ọzara Middle East. Otu onye mọnkụ nke meworo agadi, bụ́ Aịzik, kerịtara nwa okorobịa bụ́ Jọn ekpere a sitere n’Abụ Ọma nke 70 mgbe ọ gara n’ebe obibi ndị mọnkụ ndị a. Akwụkwọ Jọn - na ekpere Aịzik - nwere mmetụta dị ukwuu nke na ọbụna taa, ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu ụwa na-amalite oge ekpere ha site n'amaokwu Akwụkwọ Nsọ Aịzik nyere John Cassian. Ma n'ụbọchị gasị m dị jìì ịnụ ọkpụkpọ òkù ahụ bụ, Dabere na M, mụ onwe m, n'esonyekwa na omume ekpere a, ekele dịrị ka o kwesịrị nye John Cassian, Isaac, na ndị mọnk ibe ya maka ịmepụta ekpere a.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara