Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 15 NKE 46

John Cassian (Ijipt, 365-435)

Nke a bụ ihe ụfọdụ ndị Nna kacha ochie nyefere anyị ma ọ bụ̀ ihe anyị na-enyefe naanị obere ndị mmadụ mkpụrụ obi ha na-achọsi ike ịmata ya:

Iji dobe echiche banyere Chineke n'ime obi gị mgbe nile, i ga-arapara a hapụghị aka n'ihe usoro a emepụtara maka ịsọpụrụ Chineke: “Gbatara m ọsọ enyemaka, Chineke; Onye-nwe-m, mee ngwa ngwa bịa zọpụta m” [Psalm 70:1]

Ọbụghị n'enweghị ezi ihe kpataranụ eji họpụta amaokwu a site na akụkụ Akwụkwọ Nsọ dum, ka ọ bụrụ ngwaọrụ. O bù n'ime ya mmetụta niile nke ọdịdị mmadụ dị ike inwe. Enwere ike iji ya mee ihe n'ọnọdụ ọ bụla ma were ya megide ọnwụnwa ọ bụla, nke ọma. O bù n'ime ya ntiku enyemaka nye Chineke n'agbanyeghị ihe ize ndụ ọ bụla anyị n'eche ihu. Ọ na-egosipụta ịdị umeala n'obi nke nkwuputa dị nsọ. Ọ na-egosi nchekwa nke a mụrụ site na nchegbu na ịtụ egwù na-adịghị agwụ agwụ. Ọ na-egosipụta echiche nke adịghị ike anyị, mmesi obi ike nke ịbụ ndị a na-anụ ekpere ha, obi ike n'ime enyemaka nke na-adị mgbe niile na nke dị ebe niile. Onye na-akpọku onye na-echebe ya ruo mgbe ebighị-ebi ji n'aka na ọ nọ ya nso. Nke a bụ olu jupụtara n’ịhụnanya na nke afọ-ọma. Nke a bụ iti-nkpu obi oma-jijiji nke onye n'ahụ ọnyà nile nke onye-iro chere ya ihu, ibe akwa nke onye anọchibidoro ehihie na abali, ya n'etiku na ya apughị igbapụ, ma ọ buru na onye n'echebe-ya abịaghị zọpụta ya.

Amaokwu a dị́ mkpirikpi bụ mgbidi dị oké mmeri ndị niile na-alụso mwakpo mmụọ ọjọọ ọgụ ga-eji megide ha. Ọ bụ ihe mkpuchi-obi nke ngwá agha ọbụla na-apụghị igbowa na ọta kasị sie ike. Ọbụna ihe ọ bụla na-asọ oyi, nhụjuanya, ma ọ bụ ọchịchịrị dị n'echiche anyị, amaokwu a na-eme ka anyị ghara inwe ndakpọ olileanya maka nzọpụta anyị ebe ọ bụ na ọ na-ekpughere anyị Onye anyị na-akpọku, Onye na-ahụ mgba ndụ anyị na-agba na Onye na-adịghị adị anya n'ebe ndị na-ekpesara Ya ekpere nọ. Ọ bụrụ na ihe na-agara anyị nke ọma na mmụọ, ọ bụrụ na ọṅụ dị n'ime obi anyị, amaokwu a bụ ịdọ aka ná ntị nye anyị ka anyị ghara ịdị mpako, ka anyị ghara ịhụ onwe anyị dịka ndị dị ike n'ihi ọnọdụ dị mma anyị nọ n'ime ya, dị ka ọ na-egosipụta, a pụghị ịnọgide n'ime ọnọdụ ndị a mara mma ma ọ bụrụ na nchedo nke Chineke adịghị, nke ọ na-ekpe ekpere ka nnọgide Ya dị, na ngwa ngwa nke enyemaka Ya. Ihe m n'ekwu bụ na, amaokwu a dị́ ntakịrị, na-egosi na ọ dị mkpa ma baa uru nye onye ọ bụla n'ime anyị na n'ọnọdụ niile. N'ihi na onye chọrọ enyemaka n'ihe nile na-eme ka o doo anya na ọ na-achọ enyemaka Chineke a bụghị nanị n'ọnọdụ ndị siri ike na nke dị mwute kama nakwa n'ime ọnọdụ ihu ọma na ọṅụ. Ọ maara na Chineke na-azọpụta anyị site n'ahụhụ ma na-eme ka ọṅụ anyị na-adịte aka n'ihi na n'ọnọdụ ọ bụla, adịghị ike mmadụ apụghị ịdị ndụ ma ọ bụrụ na enyemaka Ya adịghị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara