Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ìhè Nke Ụwa - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-ỌbịbịaIhe Nhụchatụ

Light of the World - Advent Devotional

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Udo

Onye-Isi Udo

Nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Maxim Belousov, Onye Nrụkọ-Ọrụ nke OneHope na Ukraine, derè

“Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwerè ike ịghọta, gà-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.” — Ndị Filipaị 4: 7

Udo adịghị na Palestine ma ọlị n'oge a mụrụ Jizọs.

Ò sighi ike iche echiche banyere mkparịta-ụka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ n'enwe n'etiti onwe ha ebe ha na-elekọta atụrụ ha n’abalị mbụ nke Ekeresimesi ọtụtụ afọ gara aga. "Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọ n'ụjọ? Olee mgbe ihe isi-ike a ga-akwụsị? Gịnị merè Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ dị otú a n'adakwasi anyị? Ọ̀ dị mgbe udo ga-abịara anyị? Ezinụlọ anyị? Anyị onwe anyị?"

Ma n'etiti ajụjụ ndị a siri ike, obi abụọ, na nchegbu, Chineke ziterè ndị mmụọ ozi Ya, ha wee bata n'oge kachasị gbaa ọchịchịrị nke abalị we nye ha obi ike.

Kà ebube nke Onye-nwe-anyị na-enwu gburugburu, ndị mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ si, — unù chè na Chineke amaghị ọnọdụ unu — ma gị n'agụ nke a. Ọ maarà na egwù n'atụ unu, mana unu ekwesịghị ịtụ egwù n'ihi na Ọ nọ n'ocheeze Ya n'achịkwa ihe niile. Mezaya unu nọ ebe a!

Ma lelee okwu ndị ahụ ama ama siteré na Luk 2:14—

“Ka otuto dịrị Chineke n'elu kasị elu, ka udo dịrịkwa mmadụ niile nọ n'ụwa ndị ihu ọma Ya dịkwasịrị.”

Nye otu nwa agbọghọ nọ na Syria bụ́ onye nụrụ na nne na nna ya na obere nwanne ya nwụrụ na bọmbụ, okwu ndị a na-ekwe nkwa na agha ahụ ga-akwụsị.

Nye nne nke arịrị tiwara obi ya n'ihi ọgwụ n'eri ahụ, okwu a na-egosi njedebe nke ikpe ọmụma na ihe ga-eweta olileanya.

Nye mụ na gị — na ụwa dum — ha bụ̀ onyinye Ekeresimesi dị oke ọnụ ahịa. Ka anyị ṅụrịa, nyekwa Chineke otuto: amuwo Onye-nzọputa, Onye-isi Udo abịawo!

Ntụgharị Uche

Site na ọmụmụ Jizọs Kraịst, Chineke chọrọ ka anyị nweta udo ebighị ebi, ma jee ije na ihu ọma Ya. N’akụkụ ndị dị aṅaa nke ndụ gị ka ọ dị mkpa ka i nweta nkwa udo nke Chineke? Kedụ ajụjụ na mgba-uche-na-obi gasị Chineke n'emesi gị obi ike maka ha?

Arịrịọ Ekpere

Kpee ekpere maka ndị gbara ọsọ ndụ na Syria na ndị ọzọ n'agabiga ihe egwù nke agha n'ime Ekeresimesi a. Kpee ekpere ka ha nweta udo na nkasi-obi nke Chineke.

Kpee ekpere maka mmemme Ekeresimesi OneHope na Ukraine na Europe dum — ka obi ndị mmadụ meghee maka Oziọma, ka ọtụtụ ụmụaka na ndị ntorobịa na ezinụlọ ha nwee okwukwe na Jizọs Kraịst.

Ememe Ekeresimesi na Ukraine

Ndị Ukraine na-agba Ekeresimesi na Jenụwarị 7!

N'abalị ga-abọ̀ Ekeresimesi, ezinụlọ na ndị enyi gasị na-ezukọ maka oriri na-atọ ụtọ na ihe egwuregwu gasị n'enye obi añụrị. Ma ụmụaka ma ndị okenye na-aga abụ abụ Ekeresimesi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-aṅụrị ọṅụ, na-ekekọrịta kwa olileanya nke Jizọs Kraịst.

"Shchedryk" bụ egwú Ekeresimesi ọkacha mmasị nke onye Ukraine Mykola Leontovych derè na 1914. Ị nwerè ike ịmata abụ ahụ dị ka "Carol of the Bells."

Ndị Ntorobịa na-enwe mmasị ikwe ukwe abụ dị iche iche — wee n'agba egwú-ọha — n'ụlọ ahịa na n'okporo ámá na ebe ndị ozo na-ekwo ekwo maka Ekeresimesi.

Ndị otu ntorobịa na Sọndè Skụl gasị na-agbakarị mbọ pụrụ iche igagharí wee n'emesapụ́ aka ọma nye ndị obodo ha n'oge Ekeresimesi — ịga n'ụlọ ọgwụ na ụlọ ụmụ mgbei gasị inye onyinye na ịkọrọ ha akụkọ Ekeresimesi. Ụlọ ụka gasị na-emekwa ememe ihe òfùfè nke mmunye ọkụ kandụl, nke na-ejuputa na mmadụ, ndị kwere ekwe na ndị ọbịa.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Light of the World - Advent Devotional

Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu n'ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi n'afọ a. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, ememe ihe atụ mara mma nke na-eduga n'Ụbọchị Ekeresimesi, bụ̀ otu akụkụ ihe buru ibu nke ememe Ekeresimesi n'ọtụtụ mba. Ka ị na-agụ ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-akpali obi ụtọ, i gà-enwe ohere isonye ụmụnne gị na ụmụnna gị ndị kwere na Kraịst si mba ndị dị anya mee emume a wee mụta ihe site n'echiche na ọdịnala ha gasị pụrụ iche.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele OneHope maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://onehope.net/