Ìhè Nke Ụwa - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-ỌbịbịaIhe Nhụchatụ

Okwu Mmalite
Nke Onye Ndú OneHope Rob Hoskins derè
Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi afọ a — dị ka gị na ezinụlọ gị nà-ejikere ime.
Ọtụtụ gà-asọpụrụ ụbọchị a dị oké mkpa site n'ime ememme omenala dị iche iche— dị ka ikwe ukwe Ekeresimesi na mmunye kandụl ana-amụ n'ụka. Ndị ọzọ gà-asọpụrụ ọmụmụ nke Onye Nzọpụta n'ụzọ pụrụ iche na omenala nke ha — dịka iri nri na-esi ísì ụtọ, ime ememe Ekeresimesi n'ụbọchị na-abụghị Disemba 25, ma ọ bụ ikwado ọpụpụ na nnọkọ-oriri na Kentucky Fried Chicken!
Ka ị nà-agụ ihe òfùfè a na-atọ ụtọ, ị gà-enwe ohere isonyere ụmụnna gị ndị si mba ndị dị anya wee na-amụ ihe n’echiche na omenala ha pụrụ iche.
Otu ọdịnala dị otú a bụ̀ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa — ememe ihe atụ mara mma nke n'edubaga anyị rue ụbọchị Ekeresimesi. Ọ bụ otu ihe buru ibu nke mmemme Ekeresimesi n'ọtụtụ mba.
A na-emekarị ememe Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa site n’ịmunye otu kandụl kwa izu ụka ruo izu anọ. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-egosipụta na Kraịst dị ka “Ìhè nke ụwa.” Otu kandụl na-anọchi anya afọ 1,000 — nke n'egosi afọ 4,000 ụwa cheerè Mezaya ya — wee nwee ihe pụrụ iche mgbe Ọ biara.
- Izu nke Mbụ — Olileanya. N’ụbọchị ụka a, “kandụl onye amụma” na-acha odo odo na-echetara anyị na Jizọs na-abịa.
- Izu nke Abụọ — Ịhụnanya. N'ụbọchị ụka a, otu odo odo “Kandụl Betlehem” na-echetara anyị njem Meri na Josef merè gaa Betlehem.
- Izu nke Atọ — Ọṅụ. N’ụbọchị ụka nke a, "Kandụl onye ọzụzụ atụrụ" na-acha pinkị na-echetara anyị ọṅụ ụwa nwerè na ọmụmụ nke Onye-Nzọpụta.
- Izu nke Anọ — Udo. N'ụbọchị ụka a, Kandụl odo odo "Kandụl Mmụọ Ozi" na-echetara anyị ihe ndị mmụọ ozi kwerè ná nkwa na Luk 2:14 — udo n’elu ụwa.
Site n'ihe nhazi nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a, enwerè m nnukwu olileanya na kà ị na-agụ ozi ndị a, na okwukwe gị gà-esi ike n'Olileanya, Ịhụnanya, Ọṅụ na Udo.
Ihe òfùfè ndị a — nke ndị otù anyị na OneHope ná-ejé ozi n'akụkụ mba dị iche iche nke ụwa derè — gà-enye gị Okwu Chukwu na nghọta-ime gasị iji tụgharịa uche. Ọ gà-enyere gị na ezinụlọ gị aka ime ememe ọbịbịa Kraịst n'ụzọ ọhụrụ.
Na mgbakwunye, ị ga-ahụkwa ụfọdụ ekpere mkpali — ha bụ̀ maka gị na ezinụlọ gị, na maka ndị nkwenye anyị zuru ụwa ọnụ ka ha wee jiri Okwu Chineke na-agbanwe ndụ na-eru ụmụaka na ndị na-eto eto — tinyekwara akụkọ na-atọ ụtọ banyere omenala Ekeresimesi pụrụ iche sitere n’ọdịbendị.
Daalụ maka ime mmemme Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa — na ọmụmụ Jizọs Kraịst — isonye anyị na ndị kwere ekwe gburugburu ụwa! Adị m ezigbo ekele.
Chineke gozie gị na ezi na ụlọ gị n'oge Ekeresimesi a, ka ememe unu wee jupụta n'olileanya, ihunanya, ọńụ na udo nke naanị Kraịst na-eweta.
Olileanya
Ọkụ Nke Ìhè Ya Di Ka Nwa Uriom
Nke Hisho Uga, Onye isi nchịkwa mpaghara nke Peninsular Asia na Japan derè
“N'ime olileanya a ka azọpụtara anyị. Mana olileanya nke a n'ahụ anya abụghị olileanya ma-ọlị. Ònyé n'enwe olileanya n'ihe ha nwetàgorò?” — Ndị Rom 8:24
Ọgọ m nwoke bụ onye na-ede ihe egwuregwu, afọ ole na ole gara aga, o derè ihe egwuregwu banyere ụmụnne nwaanyị atọ torola eto bụ́ ndị na-agbarịta ibe ha ume n’etiti onodu ihe isi ike.
Ezinụlọ anyị niile nwerè obi ụtọ ịnụ na akwụkwọ-akụkọ ama ama nke obodo anyị gà-enyocha ihe egwuregwu ahụ — obi ụtọ anyị bawanyerè mgbe anyị gụrụ ihe ha dere:
“N’ihe egwuregwu a, ọkụ olileanya na-enwu ma apụghị ịpịnyu ya.”
Ọ bụ nyocha mara mma nke ihe egwuregwu ahụ — burukwa nleba anya dị ike na ọdịdị nke olileanya.
Olileanya abụghị ihe na-achasi ike, kama ọ bụ ire ọkụ n'enwu nwa obere nwa obere. Ọ bụghị ụda na-ama ala jijiji, kama ọ bụ ntakwunye okwu.
Olileanya anyị daberè na nkwa Chineke nke dị n’Okwu Ya — ná-ekwé nkwa na ebube Ya ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri ... n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa nke dịka ọchịchịrị ọ n'ekwu okwu karịa ìhè. Ọkacha ma ọ bụrụ na i bi n’ebe dịka Japan ebe ndị Kraịst dị ole na ole.
Ihe àmà nke olileanya anyị nwerè ike ịdị nta, mgbe ụfọdụ anaghị ahụ ya anya ma ọlị. Mana anyị na enweta nkasi obi n’eziokwu ahụ, nke bụ́ na Jizọs — Onye bụ Eze ndị eze na Onyenwenụ nke ndịnwenụ anyị — pụtara n’otu oge, n’abalị Ekeresimesi mbụ, dị ka naanị nwa ọhụrụ nọ́ n’ihe eji etinyere anụ ụlọ nri.
N’oge Ekeresimesi a, ka anyị sọpụrụ ịma mma nke ìhè ọkụ anyị n'enwulite enwulite nke bụ́ olileanya anyị — ka-anyị na-atụkwasi obi n'ìhè anyị n'agbanyeghị otú o si dị obere. Nke a gà-abụ mmalite ọmarịcha ọrụ nke Chineke dị ike.
Ntụgharị Uche
Gịnị ka ị ga-eme ka ị bụrụ ọkụ ìhè n'enwulite enwulite nke olileanya n'ime ụwa gbara ọchịchịrị? Olee obere ụzọ gasị Chineke gà-achọ iji gị wee mee nnukwu mmetụta-aka-ọma n'Ekeresimesi a?
Arịrịọ Ekpere
Kpee ekpere maka Hisho na ndị nzukọ OneHope nile ndị na-eje ozi n’ebe gbara ọchịchịrị gburugburu n'ụwa, kpee ekpere ka Chineke jiri ha we kpalite ntulite ma wuo ìhè nke olileanya n'ụzọ dị ike.
Kpee ekpere ka ụmụ Japan chọpụta na olileanya Ekeresimesi abụghị na Santa Claus, kama ọ bụ̀ na Kraịst. Rịọ Chineke ka O wèré obi aṅụrị ha n'oge mmemme a wee dọta ndị ntorobịa na ezinụlọ ha n'ebe Onwe Ya nọ.
Ememme Ekeresimesi na Japan
"Ọkụ" Ekeresimesi bụ̀ ihe na-enwu enwu nke ukwuu, ebe ọdụ ụgbọ oloko, ebe ogige ntụrụndụ, na ebe ọha na eze ndị ọzọ na-e guzobe, puku kwuru puku ọkụ mara mma na-ejupụta ebe nile.
. Nhazi oriri na nnọkọ-gasị na KFC. Ụdị ihe a nwerè ike isi ike ịghọta, mana nke a bụ ememe siri ike na Japan. KFC na-amalite ịnata ndetu-aha maka oriri na nnọkọ na be ha gasị na mbido Disemba — ma naanị ndị deturu aha ha bụ ndị pụrụ ipara bọketị anụ-ọkụkọ maka oge ezumike Ekeresimesi!
. Ekeresimesi bụ oge ezumike maka ndị di na nwunye (dị ka ụbọchị Valentine). Ndị na-eto eto na ndị enyi ha jị ụbọchị a mere oge ha n'apụ nkpaghari wee na-enyerịta ibe ha onyinye kama ịnọnyere ezinụlọ ha. Ọtụtụ mgbe, ndị na-enweghị enyi ma ọ bụ ndị nọ sọ ha na-enwe mmetụta dị ukwuu nke owu ọmụma.
· Santa Claus na-abụkarị ihe ana elegara anya n'oge a, kama Jizọs. N'ezie, ọtụtụ ndị Japan amaghị na Ekeresimesi bụ ememe ọmụmụ Kraịst. N'agbanyeghị nke ahụ, obi ụtọ na oriri na ọṅụṅụ na-eme ka ọ bụrụ nnukwu ohere maka mgbasa Oziọma — site na ihe nkiri Ekeresimesi n'ọha, ikwe ukwe Ekeresimesi, na okpukpe ụka.
N’afọ a, OneHope gà-enye ụmụ akwụkwọ akwụkwọ Ekeresimesi nke Book of Hope . Ha gà-eke akwụkwọ a n'oge ememe egwuregwu Ekeresimesi na mgbe a n'eme oriri na ọṅụṅụ Ekeresimesi n'ụka.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu n'ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi n'afọ a. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, ememe ihe atụ mara mma nke na-eduga n'Ụbọchị Ekeresimesi, bụ̀ otu akụkụ ihe buru ibu nke ememe Ekeresimesi n'ọtụtụ mba. Ka ị na-agụ ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-akpali obi ụtọ, i gà-enwe ohere isonye ụmụnne gị na ụmụnna gị ndị kwere na Kraịst si mba ndị dị anya mee emume a wee mụta ihe site n'echiche na ọdịnala ha gasị pụrụ iche.
More