Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ìhè Nke Ụwa - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-ỌbịbịaIhe Nhụchatụ

Light of the World - Advent Devotional

ỤBỌCHỊ 3 NKE 4

Ọṅụ

Ọṅụ Anyị Ná-adịgidé Adịgide

Nke Pastọ Sylvanus Elorm, Onye Isi Ntụziaka West Africa, derè

“Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, ‘Unu atụla egwù. M na-ewetara unu ozi ọma nke ga-eme ka mmadụ niile nwee ọṅụ dị ukwuu.’”— Luk 2:10

Añụrị dìrí ụwa, Onye-nwe-anyị abịawo!

Ọbịbịa nke Onye-nwe-anyị Jizọs wetarà ndị bi n'ụwa ọṅụ ana-apụghị ịkọwa. Ọṅụ — ọṅụ nke na-anọgide, ọṅụ ana-ahụ n'ebe nile n'oge Ekeresimesi. Ọ dị na ...

· Egwú ọma na-ejupụta n'ikuku nke ụlọ na ụlọ-ahịa ọbụla.

· Ihe ịchọ mma eji mee ka ụlọ gasị maa mma.

· Mkparịta-ụka gasị na-enye obi ụtọ nke ihe ụtọ na obiọma.

· Ụmụaka ná-ejupụtá n'okporo ụzọ na-eti mkpu ọṅụ na obi ụtọ.

Ọṅụ bụ ihe mere ọtụtụ ndị ji enwe ncheta Ekeresimesi dị ụtọ na dị ịtụnanya — ha ewee na-echere ya kwa afọ.

Ma gịnị bụ ọṅụ? Akwụkwọ nkọwa-okwu dị iche iche na-akọwa ya dị ka nnukwu obi ụtọ — mana obi anyị maarà na ọ karịrị naanị inwe obi ụtọ na ihe igara anyị nke ọma, ma ọ bụ ịnata ihe egwuregwu ụmụaka niile anyị chọrọ, ma ọ bụ isoro ndị anyị hụrụ n'anya na-eri nri togburu onwe ya.

Enwerè ike nweta obi ụtọ nwa oge. Ọ dịghị ete anya ya anyuo ka ọkụ. Mana ọṅụ bụ̀ ọnọdụ na-adịgide adịgide — ọnọdụ nke ịṅụrị ọṅụ n'agbanyeghị nsogbu ọbụla n'eche anyị ihu. Ezi ọṅụ kachasị ọṅụ bụ̀ na Jizọs bịarà n’ụwa, n’ihi na ọbịbịa Ya wetarà anyị niile ...

· Nnapụta

· Mkpuchi Mmehie

· Nkasi obi

· Udo

· Ike

· Nnwere onwe

· Nzọpụta

· Na ndị ọzọ!

Ọṅụ a — ọṅụ ebighị ebi— kwesịrị ka-anyị kesaara ya onye ọ bụla— karịsịa n’oge Ekeresimesi!

Ekeresimesi a, ka anyị jiri obi ike na ọṅụ na-ekwusa Oziọma Jizọs ka ọtụtụ ndị ọzọ wee nweta nnwere onwe na ọṅụ anyị nwerè n’ime Jizọs Kraịst, ma jupụta n’ọṅụ ukwuu!

Ntụgharị Uche

Ọṅụ ghọ̀rọ̀ nke anyị n'ihi na Chineke bịarà n'ụwa. Kedụ ka ị ga-esi mee emume ọñụ n'oge Ekeresimesi a? Kedụ ka ị ga-esi keritara ndị gbara gị gburugburu ọṅụ a?

Arịrịọ Ekpere

Kpee ekpere maka onye ọzụzụ atụrụ Elorm na ndị nzuko OneHope ndị ọzọ — ka Chineke gaa n'ihu na-agọzi ozi ha kà ha na ụmụaka na ndị ntorobịa na-ekerịta ọṅụ na-adịgide adịgide n'ụwa.

Kpee ekpere maka ndị na-eto eto na Sierra Leone nke West Africa — ka ọṅụ nke Onye-nwe-anyị nke n'efe-èfè dị n’obi ha n’ime Ekeresimesi a ka ha na ndị enyi na ndị ezinụlọ ha nà-eme ememe ọmụmụ Kraịst.

Kpee ekpere maka ndị nọ na ndụ gị ndị na-amatabeghị ezi ọṅụ nke Ekeresimesi. Rịọ Chineke ka O nyere gị aka inwe obi ike ina ekwusara ha Oziọma nke ọṅụ.

Ememme Ekeresimesi na Sierra Leone

Ekeresimesi bụ mmemme kacha ukwuu! Ọtụtụ mmadụ na-ezukọ maka oriri na ọṅụṅụ, na-enwe ọtụtụ ịgba egwú na obi ụtọ. Ọgbụ́gbá Bọọlụ — egwuregwu kacha ewu ewu — na-adịkwa n'oge a.

A na-egbute osikapa — nri ana-erikarị na Sierra Leone, n'oge Ekeresimesi. Ọ na-eme ka ezinụlọ ndị kasị daa ogbenye nwee ike inweta ma rie nri pụrụ iche. Ofe tomato na ọkụkọ na anụ ndị ọzọ bụ nri a na-erikarị.

Ọtụtụ ezinụlọ na-alakarị n'obodo ha maka nnọkọ na oriri na ọṅụṅụ ha na ndị ha hụrụ n'anya. Ụmụaka na ndị ka n'eto eto na-enwetakarị uwe ọhụrụ na onyinye ndị ọzọ site n'aka nne na nna ha na ndị ikwu ọzọ.

Ọtụtụ Ndị Kraịst ga-aga ụka dị nkenke n'ụbọchị Ekeresimesi. Okwu Chukwu ana ekwukari n'ụbọchị ahụ na-elekwasị anya na ọmụmụ dị umeala n'obi nke Kraịst.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Light of the World - Advent Devotional

Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu n'ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi n'afọ a. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, ememe ihe atụ mara mma nke na-eduga n'Ụbọchị Ekeresimesi, bụ̀ otu akụkụ ihe buru ibu nke ememe Ekeresimesi n'ọtụtụ mba. Ka ị na-agụ ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-akpali obi ụtọ, i gà-enwe ohere isonye ụmụnne gị na ụmụnna gị ndị kwere na Kraịst si mba ndị dị anya mee emume a wee mụta ihe site n'echiche na ọdịnala ha gasị pụrụ iche.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele OneHope maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://onehope.net/