Ìhè Nke Ụwa - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-ỌbịbịaIhe Nhụchatụ

Ịhụnanya
Onye N'ewu Àkwà-Mmiri
Nke Osvaldo Carnival, Onye Ọzụzụ Atụrụ na Catedral de la Fe na Buenos Aires, Argentina, derè.
“‘Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, ha ga-akpọkwa Ya Immanuel’ (nke pụtara ‘Chineke nọnyeere anyị’). — Matiu 1:23
N'ime usoro mmụta Injinia na mahadum, ịrụ àkwà-mmiri bụ ihe pụrụ iche.
Dị ka Boreham, onye odee Australia ama ama, kwuru gbasara onye ama nke oma n'ewu àkwà-mmiri:
Mmeri ya gasị site n'obi-ike na ihe ndị magburu onwe ya onye owu àkwà-mmiri a merè na-eduga m n'ikwubi na ndị mmadụ ịrarà ndụ ha nye n'ọrụ nke ịrụ àkwà-mmiri bụ ihe bara uru. Ọ bụ so mma ịhụ kà, gafee ọwa mmiri miri emi na osimiri iwe ọkụ, àkwà-mmiri gbasapụrụ, nke na-enye ụmụaka ohere ịgafe n'enweghị nsogbu. N'otu aka ahụ, àkwà-mmiri nke ọbụbụenyi na ezi uche nwekwarà ike imechi esemokwu dị n'etiti ndị mmadụ.
N'ime ụbọchị ndị a siri ike — mgbe ndị mmadụ na-ekewa onwe ha n'ebe ibe ha nọ, mgbe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị n'ese okwu n'ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agbụrụ, nà kà esi wee kee ha, ọ n'adiwanye oke mkpa ka ewulite àkwà-mmiri nke njikọ na ịhụnanya.
·Anyị ga-enwe ike itufu ọchịchọ nke onwe site n'iwu àkwà-mmiri nke omiko.
· Ịkpọasị na iwe enweghị ike iguzo n’ebe e nwerè àkwà-mmiri nke obiọma na ọṅụ.
· Omume ọjọọ na-amalite ịda mgbe e wucharà àkwà-mmiri nke ezi omume.
Tụlee omume Jizọs Kraịst—Onye kacha wuo àkwà-mmiri n’oge niile. O ji akụrụngwa nke ndụ Ya — malite na idị umeala n'obi nke ọmụmụ Ya n'ime ụlọ anụ ụlọ — O wurù àkwà-mmiri site n'ụwa ruo n'eluigwe, site na ọnwụ ruo na ndụ.
Anyị ga-ebi ndụ site n'ile Jizọs anya, gị onwe gị kwa nwere ike iwu àkwà-mmiri wee weta udo na ụwa kewara ekewa n'oge Ekeresimesi a!
Chineke ewepụtalarì anyị ihe ndị dị mkpa: mgbaghara, obiọma, na agbamume nke Okwu Ya. Mee ka ihe ndị a bụrụ akụrụngwa nke gị — karịsịa na oge ememe Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a — iji keritara ndị gbara gị gburugburu ịhụnanya ná-ewú àkwà-mmiri Ya.
Ntụgharị Uche
Kedụ nkewa na ikpá iche iche ị na-ahụ na mpaghara nso na ezi gị? Kedụ àkwà-mmiri dị iche iche ị nwerè ike iwulite iji weta ịdị n'otu na ịkekọrịta ịhụnanya nke Jizọs Kraịst n'ọnọdụ ndị ahụ?
Arịrịọ Ekpere
Kpee ekpere maka Osvaldo na ndị nzukọ OneHope na-eje ozi na South Central America. Rịọ Chineke ka O nyere ha aka igosipụta ịhụnanya ahụ mere ka Jizọs bịa n’ụwa, nye nwata ọ bụla ha gà-abịakwute.
Kpee ekpere maka ndị na-eto eto nke Argentina, ka Chineke gọzie ememe Ekeresimesi ha, site n'ahụ nke Kraịst, ka ha nweta ịdị n'otu n'ezinụlọ ndị gbawara agbawa na ndị obodo nke nwere ihe nwute.
Kpee ekpere ka Chineke nyere gị aka igosi ịhụnanya Ya n'ime ezinụlọ gị ... n'ime obodo gị ... na nzukọ Kraịst gị ... na gburugburu ụwa. Rịọ Ya ka O nyere gị aka iwu àkwà-mmiri ebe ha kacha dị mkpa.
Ememme Ekeresimesi na Argentina
Disemba bụ ọnwa okpomọkụ na mpaghara ndịda. Na okpomọkụ karịrị 95°F, ị gaghị ahụ Ekeresimesi ọcha nke ọdịda sno na Argentina!
N'agbanyeghị na ihu igwe na-ekpo ọkụ, a na-eri nri ọdịnala nke nwere nnukwu kalorị (nke sitere na Europe, ebe Ekeresimesi dị ezigbo oyi). Nri ndị na-esi ísì ụtọ na ọtụtụ mkpụrụ osisi a mịrị amị bara ụba.
Ememe nke bụ́ isi na-ewere ọnọdụ n'abalị chi ga-abọ̀ Ekeresimesi — a na-eri nnukwu oriri na mgbede (ihe dị ka elekere 10 ma ọ bụ 11pm), ihe ngosi ọkụ na lantern akwụkwọ ọdịnala na-esote n'etiti abalị. Ọtụtụ mmadụ na-amụ anya abalị niile!
Ụbọchị Ekeresimesi na-enwekwa ahụ iru ala ma ndị mmadụ esoro ezinụlọ ha na-anọrị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu n'ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi n'afọ a. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, ememe ihe atụ mara mma nke na-eduga n'Ụbọchị Ekeresimesi, bụ̀ otu akụkụ ihe buru ibu nke ememe Ekeresimesi n'ọtụtụ mba. Ka ị na-agụ ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-akpali obi ụtọ, i gà-enwe ohere isonye ụmụnne gị na ụmụnna gị ndị kwere na Kraịst si mba ndị dị anya mee emume a wee mụta ihe site n'echiche na ọdịnala ha gasị pụrụ iche.
More