Igwa Chineke Okwu N'ekpereIhe Nhụchatụ

INATÁ MGBAGHARA
IGWA CHINEKE OKWU
Jìrí nwayọ na olu obere kwupụta ihe ndị ị merè ndị ọzọ n'afụ ufu. Rịọ Chineke maka mgbaghara. Mgbe ị mechara nke ahụ, kelee Ya maka ịgbaghara gị.
IMABÀ N'IME
Na nrikọ nri ọzọ gị na ezinụlọ gị, mee ka onye niile yiri ihe n'afachi ntị ma ọ bụ ihe n'akwuchi ntị mana si onye ọbụla ka ha n'ekwu okwu dịka ha kwesịrị, mana ka ònyé ghara ịgbali inyere ibe ya aka ịnụ ihe ibe ya n'ekwu. Unu yirikwa ihe mkpuchi-ntị ndị ahụ ka unu n'akwapụ efere na ihe ndị unu jiri rie nri.
IMIKPỤBANYÈ
Mgbe ịna abịakwuteghị Chineke ka Ọ ghaghara gị, ọ na-adị ka ịna ajụ ige Ya ntị. Site n'ịghara ịnụ Chineke, ịna ekewapụ onwe gị n'ebe Ọ nọ, dị ka i merè mgbe ị na-enweghị ike ịnụ ezinụlọ gị nke ọma. Gụọ Abụ Ọma 32: 5, "Ekwupụtara m mmeghie m n'ebe Ị nọ ma ekpuchighị m njọ m. A sịrị m," A ga m ekwupụta gwa Chineke mmebi iwu m niile' —Ị wee gbaghara ọmụma ikpe dịịrị m maka mmehie m." Mgbe ị na-arịọ Chineke maka mgbaghara, Ọ na-agbaghara gị. Ọ na-adị ka Ọ na-ewepụ ihe mkpuchi-ntị ndị ahụ dị na ntị gị, ị wee nwe ike ịnụ Ya ọzọ.
IGWA IBE ANYỊ OKWU
- Ò nwetula mgbe ị deberè ihe ọjọọ ị merè dịka ihe nzuzo? Ọ bụrụ otù ahụ, kedụ ka idebe ihe ọjọọ ahụ dịka ihe nzuzo siri mee gị n'ahụ na obi?
- Kedụ ihe dịnụ pụrụ ime gị ka i ghara ịgakwuru Chineke wee kwupụta mmehie gị?
- Kedụ ka obi na ahụ si adị gị mgbe mmadụ gbagharalà gị ihe ọjọọ i merè ya?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ndụ èbị́m ezinụlọ nwerè ike ijupụtà n'ịrụ ọrụ, ma ya apụta na anyị enweghị ike iwepụtà oge iji kpee ekpere—ma ofọdụ ichetà inyere ụmụ anyị aka ịzụlite àgwà nke ime ka Chineke soro n'ihe ha n'eme n'ụbọchị. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ezinụlọ gị gà-ahụ etú Chineke si chọsiike ịnụ site n'aka anyị na etú ekpere si ewusi mmekọrịta anyị na Ya na ibe anyị, ike. Kwa ụbọchị gụnyerè ihe mkpali ekpere, agụm na nkọwa Akwụkwọ Nsọ dị nkenke, ihe agà eme-eme, na ajụjụ mkparịta-ụka gasị.
More
Ọ ga-amasị anyị ịkele Focus on the Family maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.FocusontheFamily.com