Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igwa Chineke Okwu N'ekpereIhe Nhụchatụ

Encouraging a Prayer Habit in Your Kids

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

ITO CHINEKE N'EKPERE

IGWA CHINEKE OKWU
Too Chineke maka íkè gị na ihe niile ị nwerè, gụnyere nri, ụlọ na ndị niile hụrụ gị n'anya.

IMABÀ N'IME
Chee echiche banyere ihe ndị ị nwerè ekele maka ha. Detuo iri n'ime ha. Gakwuru otu onye gwa ya ihe iji dị ekele maka ha n'otu n'otu, ma kelee Chineke maka ihe niile O nyere gị.

IGAKWÚ N'IME
Site na iji ekpere ngọzi dị mkpirikpi ndị metụtara ndụ anyị n'ebi kwa ụbọchị, ndị mmadụ na-amụta ka esi eto Chineke na ikwupụta ekele nye Ya. Ozugbo ị meghere anya gị n'ụtụtụ, ị nwerè ike ikpe ekpere a, "Ekelee m Gị, Chineke, maka anya m. Ekelee m Gị n'ihi na a pụrụ m ihu ụzọ." Mgbe ị n'eyi akwa gị, ị nwerè ike ikpe ekpere a, "Daalụ, Chineke m, maka ịnye m ihe niile m chọrọ — inye m efe ka m yiri, dịka ndị a m yi n'ahụ," ma ozugbo ị hụrụ anyanwụ n'apụta n'ụtụtụ gị tie, "Chineke, Ị dị nnọọ ukwuu! Daalụ maka ihe ndị Ị kerè." Abụ Ọma 145: 1-2 bụ oké ihe atụ nke otu esi eto Chineke: "M ga-eto Gị, Chi m bụ Eze; m ga ebuli aha Gị elu site n'ebighị ebi ruo n'ebighị ebi. Kwa ụbọchị m ga-eto Gị ma bulie aha Gị elu site n'ebighị ebi ruo n'ebighị ebi." Too Chineke taa nà ụbọchị niile!

IGWA IBE ANYỊ OKWU
- Kedụ ka idepụta ihe ndị ị nwerè ekele maka ha siri gbanwee ka isi akpa àgwà?
- Ọ bụrụ na gị amalite ito Chineke maka ihe niile O nyere gị, ogologo oge ma ọ bụ ụbọchị ole ka ọ ga-ewe?
- Olee otú ito Chineke nwerè ike isi agbanwe gị?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Encouraging a Prayer Habit in Your Kids

Ndụ èbị́m ezinụlọ nwerè ike ijupụtà n'ịrụ ọrụ, ma ya apụta na anyị enweghị ike iwepụtà oge iji kpee ekpere—ma ofọdụ ichetà inyere ụmụ anyị aka ịzụlite àgwà nke ime ka Chineke soro n'ihe ha n'eme n'ụbọchị. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ezinụlọ gị gà-ahụ etú Chineke si chọsiike ịnụ site n'aka anyị na etú ekpere si ewusi mmekọrịta anyị na Ya na ibe anyị, ike. Kwa ụbọchị gụnyerè ihe mkpali ekpere, agụm na nkọwa Akwụkwọ Nsọ dị nkenke, ihe agà eme-eme, na ajụjụ mkparịta-ụka gasị.

More

Ọ ga-amasị anyị ịkele Focus on the Family maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.FocusontheFamily.com