Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igwa Chineke Okwu N'ekpereIhe Nhụchatụ

Encouraging a Prayer Habit in Your Kids

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

CHINEKE NWERÈ AGỤỤ UKWUU BANYERE MMEKỌRỊTA GỊ NA YA

IGWA CHINEKE OKWU
Kelee Chineke maka ụzọ niile O si wee n'ahụ gị n'anya ma n'elekọta gị. Rịọ Ya ka O gwa gị ogologo oge ole Ọ chọrọ ka gị na Ya na-akparịta ụka kwa ụbọchị.

IMABÀ N'IME
Chịtá iko glass ole na ole wee kwụbá ha otu n'akụkụ ibe ya n'elu sinkị gị na kichin. Otu n'otu, were mmiri si na taapụ gbajuo ha. Kparịta ka ị pụrụ isi were mmiri ju iko ọbụla n'ime ụlọ gị ma mmiri aka na-esi n'ime taapụ asúpụta. N'otu aka ahụ, agụụ Chineke maka gị apụghị ịkwụsị.

IMIKPỤBANYÈ
Chineke nọ maka gị n'oge niile. Dị nnọọ ka ị pụrụ isi jiri mmiri gbajuo iko kwa iko site n'igbanye taapụ, otú ahụ ka ị pụrụ isi n'enweta ụtọ nke ọnụnọ Chineke site ịgakwuru Ya n'ekpere. Gụọ Aịzaya 30:18: "Ma Onye-nwe-anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute Ya, ka O gosi unu ịhụnanya Ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onye-nwe-anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka Ya!" Chineke chọrọ ka ị torukwuo Ya nso, ka ijupụta na ịhụnanya na udo Ya, n'ihi na agụụ nke ihe kachasị dị nma maka gị bụ ihe dị Ya n'obi. Ọ bụ ezie na Chineke na-arụ ọrụ maka gị, mana Ọ chọrọ ka ịna enye Ya nzaghachi, n'egosipụta njikere ịdị ka gị na Ya bie ndụ ka otu. Otu ụzọ ị pụrụ isi mee nke a bụ ịgwa Ya okwu kwa ụbọchị.

IGWA IBE ANYI OKWU
- Kedụ onye ị kachasị achọ ịgwa ma ọ bụ ikwusara okwu, ma gịnị kpatara onye a jiri bụrụ onye kachasị gị mma ikwusara okwu?
- Kwuo maka otu oge ị chosịrị ike ịgwa onye a okwu. Gịnị kpatara o jiri gusie gị agụụ ike ikwusara onye a okwu ma ọ bụ igwa ya ihe?
- Gịnị kpatara ọ ga-eji n'agụsi Chineke agụụ ike ka O meere gị amara?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Encouraging a Prayer Habit in Your Kids

Ndụ èbị́m ezinụlọ nwerè ike ijupụtà n'ịrụ ọrụ, ma ya apụta na anyị enweghị ike iwepụtà oge iji kpee ekpere—ma ofọdụ ichetà inyere ụmụ anyị aka ịzụlite àgwà nke ime ka Chineke soro n'ihe ha n'eme n'ụbọchị. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ezinụlọ gị gà-ahụ etú Chineke si chọsiike ịnụ site n'aka anyị na etú ekpere si ewusi mmekọrịta anyị na Ya na ibe anyị, ike. Kwa ụbọchị gụnyerè ihe mkpali ekpere, agụm na nkọwa Akwụkwọ Nsọ dị nkenke, ihe agà eme-eme, na ajụjụ mkparịta-ụka gasị.

More

Ọ ga-amasị anyị ịkele Focus on the Family maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.FocusontheFamily.com