Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Ọṅụ
Egwú Ekeresimesi gasị na-emesi anyị obi ike na oge a bụ oge eji enwe aṅụrị. Manà ọ bụghị anyị nile nwerè ihe na-eme anyị obi ụtọ, ọ dịghịkwa onye pụrụ inwe obi ụtọ mgbe nile. N'inye ekele, ebe ọ bụ na obi ụtọ abụghị ihe na-adịgide, kama ọ na-abịa na-ala mgbe ọbụla, anyị pụrụ inwe ọṅụ mgbe niile.
A na-aghọtahie obi ụtọ na ọṅụ mgbe ụfọdụ n'ọdịbendị anyị, ma ha abụọ abụghị otu ihe ahụ. Obi nwere ike ịdị anyị ụtọ mgbe ihu igwe dị mma, ụmụ anyị na-erubere anyị isi, anyị nọ na-ezumike, ma ọ bụ na anyị zụtara ụgbọ ala ọhụrụ. Mmetụta elu elu ahụ bụ̀ obi ụtọ. Ọṅụ bụ ihe dị omimi karịa. Ọ bụghị ihe ndapụta. O nweghị ihe jikọrọ ya na ihe ndị a ana-ahụ anya nke ụwa a. Ọ dabere naanị na Kraịst. Ọn̄ụ dị na nzọpụta anyị na n’àjà ahụ nke chekwaberé ebighị ebi anyị.
N’oge ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, otu n’ime ndị omekome ahụ a kpọgidekwarà n’obe jụrụ ihe mere na Jizọs azọpụtaghị Onwe Ya ma ọ bụrụ na ọ bụ Ya bụ Mezaya ahụ n’ezie. Nke ahụ bụ ajụjụ ziri ezi. Onye ọ bụla nke hụrụ ihe ngosi nke mkpọgide n'obe nke ndị Rom, ma karịsịa onye nọ n'ihe mgbu dị egwù, ga-ajụ ụdị ajụjụ ahụ. Kedụ ihe kpatara iji họrọ ịtachi obi wee taa ụdị ahụhụ a ma ọ bụrụ na i nwerè ụzọ isi gbanahụ ya?
N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaarà Ndị Hibru, o kwuru na Jizọs nagiderè obe “n’ihi ọṅụ e deberè n’ihu Ya.” Ee, ịnwụ ọnwụ n'egbu mgbu n'ihi mmehie anyị abụghị ihe tọrọ Jizọs ụtọ. O nwerè oké ihe mgbu nke mmụọ, uche, na nke anụ arụ. O jighị obi ụtọ gaa n’obe, kama O ji ọṅụ. Jizọs maarà na ihe na-echere Ya bụ ebighị ebi nke Nna Ya na mbikọrịta anyị na Ya. O nwere ọṅụ n’ịmara na ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Ya gà-emeri nrara-onwe, obi mgbawa, ihe mgbu na ọnwụ nke ụwa a.
Anyị nwerè ọṅụ n'ihi otu ihe ahu. Ọbụna n’oge ndị kasị sie ike, anyị na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị maarà na anyị nwerè olileanya ebighị ebi na ọdịnihu. Dị ka Jizọs gosiri anyị, inwe ọṅụ apụtaghị na anyị agaghị enwe ihe mgbu. Ya merè, ọtụtụ mgbe na ndụ a, ọṅụ na ihe mgbu na-ebikọ ọnụ. Otú ọ dị, dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị pụrụ ilefè ihe mgbu anya n'ihe e kwere anyị ná nkwa ma mara na Chineke nwerè ihe dị ukwuu maka anyị. Otu ụbọchị, anyị na Chineke ga-ebikọta ọnụ n'ebe na-enweghị ihe mwute, ịkwa ákwá, ma ọ bụ ihe mgbu.
Ma eleghị anya n'oge ezumike a, ndị ọgọ gị n'atá gị ụta n'esepughị aka, ị nọ n'etiti ihe isi ike nke ego, ma ọ bụ na ihe ịchọpụtara n'ụlọ ọgwụ gbasara onwe gị n'eyi gị egwù. Eleghị anya, ọ na-esiri gị ike inwe obi ụtọ. N'agbanyeghị ihe ị na-eme n'oge Ekeresimesi a, màrá na Chineke ghọtarà. Ọ na-ahụ gị, Ọ hụru gị n'anya, ọ dịghịkwanu mgbe Ọ ga-ahapụ gị n'ihe mgbu n'esogbu gị. Ọbụlagodi n’ime oke mwute, n'enwe ọn̄ụ n’ihi na ekwerè gị ebighị-ebi na nkwa ma nkwa Ya bụ eziokwu.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.
More