Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Olileanya
Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-agba Ekeresimesi dika ụzọ isi n'echeta olileanya anyị nwere n’ime Jizọs. Gịnịzi merè o ji dị mfe inwe mmetụta enweghị olileanya n’oge emume a n’afọ? Ikekwe ọ bụ n’ihi na anyị aghọtachaghị ihe olileanya bụ̀ na ebe o si abịa.
Jeremaya 29:11 bụ otu n’ime amaokwu n'Akwukwo Nsọ kacha ewu ewu banyere olileanya. Ọ na-ekwu, sị, “N’ihi na amaara M atụmatụ ndị M n'emere gị,’ ka Onye-nwe-anyị kwuru, ‘atụmatụ ime gị nke ọma, a bụghị imerụ gị ahụ́, atụmatụ inye gị olileanya na ọdịnihu."
Okwu a abụghị naanị okwu mara mma anyị ga-edewe kobe n'ụlọ, ma ọ bụ dee n'Iko anyị ji aṅụ kọfị. Kama ọ bụ nkwa Chineke nyere anyị ka anyị jidesie ike mgbe anyị nwere mmetụta enweghị olileanya. Ọ bụ ezie na okwu ndị a bụbù maka ụmụ Izrel mgbe ha nọ na ndọrọ n’agha na Babilọn, Chineke ka dị otu Ọ dị oge ahụ, ụbọchị taa. N'ihi na àgwà Ya adịghị agbanwe agbanwe, anyị nwere ike ịtụkwasị obi na nkwa a ka bụ eziokwu nye anyị ụbọchị taa.
Ikwu eziokwu, ọ bụrụ na anyị achọ nkwa ndị a, anyị ga-ahụ nkwa gasị Chineke kwere anyị ka ha jupụtara n'ime Agba Ochie. Ugboro ugboro, site na akụkọ nke ndị Ya, Chineke na-egosi anyị onye Ọ bụ ma gosikwa anyị na Ọ bụ Onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi.
Otu n’ime nkwa mbụ Chineke kwere anyị bụ na Jenesis mgbe Chineke kwuru na Ya ga-esi n’aka Ebraham gọzie mba nile nke ụwa. Ihe Chineke na-ekwu bụ na Mezaya ahụ ga-abụ onye sitere n’eriri Ebraham, Ọ ga-azọpụtakwa mmadụ nile na mmehie ha—ọ bụghị nanị ndị Juu, kama onye ọ bụla nke kwere na Ya. Ka e mesịrị, n’ime Agba Ọhụrụ, anyị n'ahụ ihe àmà n'egosi na Chineke na-emezu okwu Ya. Akwụkwọ Matiu na-egosi anyị na usoro ọmụmụ Jizọs sitere na Ebraham, akwụkwọ Jọn ewee na-agwakwa anyị na onye ọ bụla nke kwere na Jizọs ga-enwe ndụ ebighị ebi. Chineke anyị bụ Onye na-edebe nkwa O kwere. Ọ bụ olile-anya-anyị dị ndụ.
Olileanya adịghị esite n’ihe onwunwe ma ọ bụ nkwa efu nke ụwa a. Ezi olileanya na-abịa site n’ịmara na anyị na Jizọs ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. A tụlee ibi ebighị ebi n'eluigwe, ọnọdụ ọbụla anyị n'eche ihu ugbu a ga-adị nnọọ ka ihe ntabi anya. Mana nke a apụtaghị na anyị agaghị enwe ihe mgbu, ọ pụtara na anyị nwere ike ịhọrọ ilepu anya n'ihe mgbu anyị ugbu a ma legide anya n'ọdịnihu ka mma nke ga-abịa.
Ihe ọ bụla ị n'agabiga n’oge ezumike a, lekwasị anya ná nkwa Chineke maka olileanya. Ọ dịghị mgbe Ọ ga-ahapụ gị, Ọ dịghịkwanu mgbe Ọ ga-agharipu gị. Ọ ga-agbaghara gị mgbe niile ma n'eduzi gị mgbe niile. Ọ bụ ike gị, nkume gị, na nchebe gị. Mgbe ọ dị gị ka ị nwekataghị mee ofụma, nwee afọ ojuju, ma ọ bụ zuo okè, cheta na mgba ndị a adịghị adịgide, na Chineke nwere ihe ndị ka ukwuu maka gị. Ọ hụrụ gị n'anya nke ukwuu, ọ na-agụkwa Ya agụụ ka gị na Ya na-anọrị. Cheta na O kwere gị nkwa ọdịnihu, nkwa karịrị ihe ọbụla ị pụrụ ịchetụ n'echiche.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.
More