Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Living Changed: At Christmas

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Atụmanya

Oge ezumike jupụtara na ihe ịtụnanya na ọṅụ. Enwere ọtụtụ ihe a ga-atụ anya ya, site na ngosipụta gasị ọkụ Ekeresimesi, nnyekọrita onyinye, nnukwu nnọkọ ezinụlọ, rue na nri pụrụ iche anyị na-eri naanị n'oge a n'afọ. Atụmanya na obi ụtọ jupụtara n'ikuku ka ana akwado ime ememe ọmụmụ Jizọs.

Ụdị atumanya ahụ dị kwa n'etiti ndị Juu mgbe a mụrụ Jizọs. Ha nọ n'atụ anya ọbịbịa Mezaya ahụ. Onye ahụ ga-abịa zọpụta ha. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Chineke nọ na-agwa ha gbasara atụmatụ Ya nke ịzọpụta ha, ma ihe niile ga-amalite n'ọmụmụ nwa nwoke site na nwa agbọghọ n'amaghị nwoke.

Ihe dị ka narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs, Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Ya mere, Onye-nwe-anyị n’Onwe Ya ga-enye unu ihe ịrịba ama: Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, ma kpọọ Ya Immanuel.”

Obere oge tupu a mụọ Jizọs, otu ihe ahụ onye amụma ahụ kwuru pụtaghachirì. Mmụọ ozi gwara Josef, bụ nna-ụwa nke Jizọs, na nrọ nke abalị si ya:

"Nwa agbọghọ a ga-amụ nwa nwoke, ị ga-akpọ aha Ya Jizọs, n'ihi na Ọ ga-esi na mmehie zọpụta ndị Ya.”

Ihe a niile mere ka okwu nke Onye-nwe-anyị kwuru site n’ọnụ onye amụma wee mezue: “Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, aga-akpọkwa Ya Immanuel” (nke pụtara “Chineke nọnyeere anyị”).

Nke a bụ naanị otu n'ime ọtụtụ ihe atụ nke amụma e mezuru site n’ọmụmụ Jizọs. Mgbe nke a gafechara, n’oge nile Jizọs jere ozi Ya, O kwere ndị Ya ọtụtụ nkwa dị iche iche banyere ihe ndị gaje ịbịa. O kwuru na Ya ga-esi na ndị nwụrụ anwụ bilie wee merie mmehie. O kwuru na Ya ga-ezite Mmụọ Nsọ ka Ọ bụrụ onye-inyeaka ha wee duzie ha. O kwuru na Ya ga-aga i kwadoro ha ébé ma lọghachi kwute ha otu ụbọchị. N’ihi na Chineke mezuru nkwa nile O kwere ha nke izite Onye Nzọpụta, ndị ahụ kwenye kwara na nkwa ndị a.

O nweghị otu n'ime nkwa ndị ahụ mebiri. Nkwa ndị ahụ ka bụkwa eziokwu nye anyị taa! Otú a ka anyị ga-esi lee ọmụmụ Jizọs anya wee mara olileanya mezugoro na olileanya nke na-abịa. Dị ka ndị Juu cheerè ọbịbịa nke Onye Nzọpụta, anyị na-eché nlọghachí O kwere ná nkwa.

Ka ị na-aga n'eme ihe n’oge ezumike a, nwee okwukwe na nkwa Chineke dị eziokwu ma bụrụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi. A bụghị naanị maka ndị ọzọ, kama kpọmkwem maka gị onwe gị. Mgbe ị n'enwe mgba okwukwe, họrọ ilekwasị anya na Onye Ọ bụ na ihe niile O meere gị. Site n'ile anya ma ịtụkwasị uche na nkwa ebighị ebi e kwewoorò anyị, ọ ga-ekwe omume n'oge ezumike a, iji olileanya bie ndụ n'ọnọdụ n'enweghị olileanya, inwe okwukwe n'oge ọnwụnwa, inwe ọṅụ n'agbanyeghị ọnọdụ ọbụla anyị nọ n'ime ya, na inwe udo n'etiti ọgba aghara.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: At Christmas

N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com