Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Living Changed: At Christmas

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Okwukwe

Ọ pụrụ ịdị mfe mmadụ ịdaba n'ọgbaghara nke oge Ekeresimesi wee chefuo ihe mere anyị ji eme ememe a. Ọ bụ ezie na anyị na-achọ ịbụ ìhè nye ndị gbara anyị gburugburu, mana mgbe ụfọdụ ọ na-abụrụ anyị ihe nsogbu ịnyagharị ihe ngbakasi-ahu nke oge Ekeresimesi. Kama ịnọgide n'ihe nchegbu, n'iwe, na mmejọ, okwukwe anyị nwere na Jizọs pụrụ inyere anyị aka ibi ndụ n'ụzọ dị iche n'oge ezumike a.

N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Efesọs, o merè ka anyị ghọta otú okwukwe anyị nwerè ike isi mee ka echiche anyị sikwuo ike mgbe ọ na-agba anyị ume iyirì ekike-agha nke Chineke kwa ụbọchị. O depụtarà ihe agha ndị ahụ ka: eriri-úkwù nke eziokwu, ihe-nchekwa-obi nke ezi omume, akpụkpọ-ụkwụ nke Oziọma udo, ọta nke okwukwe, okpu-agha nke nzọpụta, na mma agha nke Mmụọ Nsọ, nke bụ Okwu Chineke. Ibé ihe agha ndị a bụ iji chetara anyị ike na nchekwa anyị nwerè n’ime Kraịst.

N'ụzọ na-akpali mmasị, otu n'ime ihe agha Pọl nyerè nkọwa pụrụ iche bụ ọta nke okwukwe. Ọ sịrị na o nwere ikike “imenyụ akụ niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” Kwụsịtụ obere oge we lee ọnọdụ ịma atụ a anya. Akụ ndị na-enwu ọkụ nà-adakwasị gị mana njide ọta gị megide ha merè ka ha bụrụ ihe efu, ihe n'adịghị ike kpam kpam. Okwukwe anyị bụ ngwá ọgụ dị ike megide atụmatụ ndị iro anyị!

Mgbe ụfọdụ, anyị na-adị mgbagwoju anya banyere onye bụ onye iro. Anyị nwerè ike ichè na ọ bụ onye ahụ so anyị na-azụ ihe n'ụlọ ahịa n'oge ezumike a gwara anyị okwu iwe, Onye-isi nke chụrụ anyị n'ọrụ tupu Ekeresimesi abịa, ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị n'agwa anyị okwu ọjọọ mgbe niile. Ndi gbara anyị gburugburu abụghị ndị iro anyị, ezi onye iro anyị bụ ekwensu nke na-ejeghari dịka ọdụm, na-ebighari aka na-ele anya ka o zuru ọṅụ anyị, gbuo olileanya anyị, na mebie udo anyị. Ọ bụ eziokwu na ọnọdụ a na-akpali egwù na ụjọ, mana anyị ekwesịghị inwe nchegbu maka ya, anyị ekwesịghị ịtụ egwù. Chineke anyị dị ike karịa ihe ọ bụla nwere ike imegide anyị.

Ọ bụ ezie na ihe agha ndị a bụ onyinye sitere n'aka Chineke iji chebe anyị, anyị ka ọ dịịrị ịdị uchu iyikwasị ha. Iyikwasị ha dị nfe dịka ikpe ekpere kwa ụbọchị, si:

Chineke, aghọtara m na m nọ n’agha ime mmụọ, mana atụkwasịrị m Gị obi maka nchebe. Ana m eyiri eriri-úkwù nke eziokwu; nyere m aka ịnụ na ikwu eziokwu. Ana m eyikwasi ihe-nchebe-obi nke ezi omume; Chebe obi m ma nyere m aka imeghe ya maka nduzi Gị. Ana m eyikwasi akpụkpọ-ụkwụ nke Oziọma udo; nyere m aka ịgwa ndị ọzọ gbasara Gị na iwetà udo ebe ọ bụla m na-aga. Ana m eyikwasi ọta nke okwukwe; nyere m aka ịtụkwasị Gị obi, chekwa m ka m we ghara ịdaba n'aka ndị iro. Ana m eyikwasi okpu-agha nke nzoputa; Chebe uche m ma nyere m aka ichè naanị ihe dị mma. Ana m eburu mma-agha nke Mmụọ Nsọ; nyere m aka icheta Akwụkwọ Nsọ, iji Ya gbachite onwe m na ndị ọzọ. Amen!

Ekeresimesi nke a, ka anyị mụrụ anya, ka anyị nọrọ na nche megide mwakpo nke ndị iro. Cheta na ọgụ gị abụghị megide ndị gbara gị gburugburu. Guzosie ike n'eziokwu ahụ bụ́ na Chineke hụrụ gị n'anya nke ukwuu ka i wee nwee ike ime ka iwe ọ bụla nke na-abịara gị kwụsị ngwa ngwa. Wèré ike gị niile hụ ndị gbara gị gburugburu n'anya, karịsịa ndị ahụ na-akparị mmadụ, n'ihi na ị maghị ihe mgbu nzuzo ha pụrụ ina agabiga. Iyirì ihe agha nke Chineke kwa ụbọchị gà-enyere gị aka ime ihe ndị a mgbe ọbụla.

Tupu ị gawa ịzụ ahịa, yiri ihe agha. Tupu ị banye na mkparịta ụka siri ike, yiri ihe agha. Tupu ị gaa mgbakọ ezinụlọ gị, yiri ihe agha. Tupu obi nkụda arikwute gị, tupu ndidi gị adalata, na tupu ị zaghachi n'iwe, yiri ihe agha. Anyị kwesịrị inwe ntụkwasị obi zuru okè na ngwa agha Ya na ike nke okwukwe anyị. Mgbe anyị dị ntụkwasị obi n'ilekwasị Chineke anya maka ike, Ya onwe Ya gà-adikwa ntụkwasị obi ichebe anyị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Living Changed: At Christmas

N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị Changed Women's Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.changedokc.com