Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 17 NKE 25

Ụbọchị Nke Iri Na Asaa: Gụọ Luk 2:1-5

Achọọla ịmụ Jizọs! Mana Meri na Josef ga-agarirí Betlehem maka ọnụ-ọgụgụ ndị mmadụ (ịgụ ndị mmadụ site n'obodo ruo n'obodo). Ị chetula otu ọ ga-adị ime njem tere anya otu ahụ n'azụ ịnyịnya-ibu? Ma ọ bụ ọbụna ije ije n'akụkụ ya, dị ka Josef mere, n'edu ịnyịnya-ibu ahụ ịga ebe ọ kwesịrị ịga? Ha ji ụkwụ jee ije ọtụtụ ụbọchị iji ruo Betlehem. Ọ ga-abụrịrị na ezigbo ike gwụrụ ha!

Ihe Omume: Ka anyị mee ka ànyị bụ̀ Meri na Josef wee gaa ụdị njem ha gara! Gaa bute akpa njem gị, jide ịnyịnya-ibu (i nwere ike iji akwụkwọ eji ekechi ngwóngwó mee ịnyịnya-ibu gị), ka anyị mee n'ụdị ejijé, ogologo njem ahụ ruo Betlehem!

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com