Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Taa bụ ụbọchị ịgụ agụmagụ ihe òfùfè ọbụla i n'enweghị ohere ka gị na ụmụ gị gụọ na ịgba obi gị ume site n'Okwu Chineke!
-
Gụọ Akwụkwọ Nsọ taa ma kpee ekpere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu n'obi gị. Ekeresimesi bụ oge kacha mma iji gwa ndị i hụrụ n'anya n'amatabeghị Kraịst, maka Jizọs, ka ha nabata Ya dịka Onye-nwe-ha na Onye Nzọpụta ha. Kpee ekpere ka Mmụọ Nsọ dotá ndị gị ahụ ka ha bịakwute Kraịst.
- Kpee ekpere nyefee Chineke ụbọchị gị. Rịọ Onye-nwe-anyị maka amamihe, ọgụgụ-isi, na ọmịiko. Kpee ekpere ka di gị na ụmụntakịrị gị mara Jizọs ma ọ bụrụ na ha amaghị Ya, na ka Mmụọ Nsọ duru ha baa n'eziokwu niile. Ọ bụrụ na ha bụ Ndị Kraịst, kpee ekpere ka ha bie ndụ ha maka Ya n’ike nke Mmụọ Nsọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com