Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Iri Na Isii: Gụọ Maịka 5:2
Olee ebe amaokwu a kwuru na a ga-amụ Jizọs? E dere amụma a ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Chineke haziri ihe niile gbasara ọmụmụ Jizọs (ọnụọgụgụ e mere ndị mmadụ, njem Josef na Meri na Betlehem, wdg.) ka ihe niile mee dịka O kwuru na Ọ ga-eme! Chineke anyị bụ Nna mazurù ihe nile! Ọ na-eme ihe Ọ sị na Ọ ga-eme mgbe niile!!
Ihe Omume: Gụọ nụ abụ bụ́ “Obere Obodo Betlehem”. Unu nwere ike ịme ngwá-egwú jiri ite ma ọ bụ paanụ̀ na ngaji iji mee ka ọgụgụ egwú unu dịkwuo ụtọ.
*Hụ na i lelerè ụbọchị iri abụọ na ise nke atụmatụ ihe ọgụgụ a maka njikọ ga-eduga na egwu a bụ Obere Obodo Betlehem na akụrụngwa ndị ọzọ maka atụmatụ ihe ọgụgụ a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More