Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Iri Na Itoolu: Gụọ Luk 2:6-7
Amụwó Onye Nzọpụta anyị! Toonụ Onye-nwe-anyị maka nnukwu ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ! Ka anyị kpee ekpere ekele maka ịhụnanya Chineke na otú O si elekọta anyị! O nyewo anyị ụzọ anyị ga-esi laghachikwute Ya ma soro Ya nwee mmekọrịta! Lee Nna dị ịtụnanya na ọmarịcha Onye Nzọpụta anyị!
Ihe Omume: Hazie otu ụbọchị ime ememe oriri na ọṅụṅụ maka ọmụmụ Jizọs n'izu a! Ị nwere ike ịchọta ntụziaka otu esi eme nke a.
*Hụ na i lelerè ụbọchị iri abụọ na ise nke atụmatụ ihe ọgụgụ a maka njikọ ga-eduga na echiche-gasị otu esi ahazi mmemme oriri na ọṅụṅụ maka ọmụmụ Jizọs na akụrụngwa ndị ọzọ maka atụmatụ ihe ọgụgụ a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More