Òmùmé-Gasị Nke NchegharịIhe Nhụchatụ

Chineke ziterè Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya n'Ụwa maka ebumnuche a bụ́ isi: iji nye anyị ndụ ọhụrụ. Na Luk 5:27-32, Jizọs kwughàrirì ọrụ Ọ bịara ịrụ n'ụzọ a: "Ọ̀ bụghị ndị àhụ́ dị̀ chọrọ dọkịta, kama ọ bụ̀ ndị na-arịa ọrịa. Abịaghị M ịkpọ ndị ezi omume, kama ndị mmehie ka ha chegharịa." Kraịst bịarà ka ndị mmehie dịka mụ na gị nwee ndụ ọhụrụ site ná nchegharị anyị na mgbaghara Ya. Ndụ anyị nà-abụ nke gbanwere nke ebighị-ebi mgbe anyị chègharịrị̀ wee rịọ mgbaghara Ya. Ọrụ Kraịst bụkwa ọrụ anyị. Akpọghị anyị ka anyị gaa leta ndị ezi omume, kama ka anyị gakwurú ndị furú efù na ndị mgbaghara dị mkpa. Ọ bụrụ na ijila obi gị niile chegharịa nà njọ gị ma Chineke agbaghàrawó gị ha, yabụ́ na ị nwerè akụkọ ịga akọrọ ndị mgbaghara dị mkpa. Akụkọ ka ndụ gị si wee gbanwee pụrụ ịmepụtà otu mgbanwe ahụ n'ime ndụ onye ọzọ. Ònyé kà ị mà ọ dị mkpa ka o chegharịa ma nata mgbaghara Chineke? Kedụ ka akụkọ gị kà Chineke si wee gbaghara gị gà-esi nyere onye ọzọ aka ịbịa na nchegharị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nchegharị bụ otu n'ime omume dị mkpa anyị niile nà-eme n'ịmata Kraịst dịka Onye-Nzọpụta anyị. Nchegharị bụ omume anyị ma mgbaghara bụ mmeghachi omume Chineke n'ebe anyị nọ site n'ịhụnanya zuru okè O nwerè n'ebe anyị nọ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise, ị gà-enweta ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ya na obere ihe òfùfè e merè iji nyere gị aka ịghọta nke ọma mkpa nchegharị dị nà njem anyị na Kraịst. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lee www.finds.life.church
More
We would like to thank Life.Church for providing this plan. For more information, please visit: www.life.church