Òmùmé-Gasị Nke NchegharịIhe Nhụchatụ

Abụ Ọma 51 bụ̀ mkpu ákwá nchegharị Devid tikụrụ̀ Chineke maka ụdị mmehie o merè site na ndinà ya na Batshibà. Ị pụrụ iji anya uche gị wee hụ ka Devid sekpù ala wee jiri olu ike n'eti ma n'arịọ Chineke ka Ọ sachapụ́ mmehie ya. Abụ Ọma a n'enye anyị ihe ngosi nke ihe nchegharị kwesịrị iyì ka na ndụ anyị. Nke mbụ, Devid kweterè na ya merè njọ ma kwupụta ya. Nke ọzọ, ọ rịọrọ Chineke maka mgbaghara. Mgbe o mecharà nke a, ọ rịọrọ Chineke ka O mee ka ya dị ọhụrụ. Nke ikpeazụ, ọ rịọrọ Chineke ka O nyere ya aka iji mmehie ya kụziere ndị ka n'eme njọ na ndị ọ dị mkpa ka ha mee nchegharị, ihe. Kedụ ihe nchegharị yirì kà n'ime ndụ gị? Kedụ ka gị isò ọmụmaatụ nchegharị Devid gà-esi mee ka mmekọrịta gị na Chineke sikwuo ike?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nchegharị bụ otu n'ime omume dị mkpa anyị niile nà-eme n'ịmata Kraịst dịka Onye-Nzọpụta anyị. Nchegharị bụ omume anyị ma mgbaghara bụ mmeghachi omume Chineke n'ebe anyị nọ site n'ịhụnanya zuru okè O nwerè n'ebe anyị nọ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise, ị gà-enweta ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ya na obere ihe òfùfè e merè iji nyere gị aka ịghọta nke ọma mkpa nchegharị dị nà njem anyị na Kraịst. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lee www.finds.life.church
More
We would like to thank Life.Church for providing this plan. For more information, please visit: www.life.church