Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Òmùmé-Gasị Nke NchegharịIhe Nhụchatụ

Acts of Repentance

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Nchegharị nà-arụpụta mgbaghara. Anyị n'eme nchegharị ma Chineke ana agbaghara. Nchegharị na mgbaghara abụghị ihe ndị siri ike. Nchegharị bụ ihe anyị n'eme ma mgbaghara bụ mkpasi-àgwà Chineke n'eme anyị sitere n'ịhụnanya Ya zuru okè maka anyị. Usoro ime nchegharị dị mfe, mana ike nke mgbaghara Chineke abụghị nke a pụrụ ịkọwa. Mgbaghara Chineke nà-ekpochapụ kpamkpam ọchịchịrị niile dị n'ime ndụ anyị ma ná-akpọbatá anyị n'ime ìhè n'agbanyeghị njọ niile anyị meworò. Mgbaghara Chineke nà-ekpuchi mmehie NIILE gụnyere nke gị. Kedụ kà ike mgbapụta nke mgbaghara Chineke sìrì wee gbanwee na metụta ndụ gị?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Acts of Repentance

Nchegharị bụ otu n'ime omume dị mkpa anyị niile nà-eme n'ịmata Kraịst dịka Onye-Nzọpụta anyị. Nchegharị bụ omume anyị ma mgbaghara bụ mmeghachi omume Chineke n'ebe anyị nọ site n'ịhụnanya zuru okè O nwerè n'ebe anyị nọ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise, ị gà-enweta ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ya na obere ihe òfùfè e merè iji nyere gị aka ịghọta nke ọma mkpa nchegharị dị nà njem anyị na Kraịst. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lee www.finds.life.church

More

We would like to thank Life.Church for providing this plan. For more information, please visit: www.life.church