Òmùmé-Gasị Nke NchegharịIhe Nhụchatụ

Ò nwétulá mgbe i furù efù? Ọ pụrụ ịbụ mmetụta kachasị akpali iwe gị amaghị ebe ịna aga. Ikwu eziokwu, ọnọdụ efùm efù ụfọdụ pụrụ íyì nnukwu egwù. N'amaokwu 25, Pita n'eji anyị atụnyere ụmụ atụrụ n'ụdị na mgbe anyị nọ n'ebi ndụ n'ime mmehie, anyị bụ̀ ndị gahierè ụzọ na ndị furú efù. Anyị amaghị ebe anyị kwesịrị ịga, mana kà anyị mecharà nchegharị maka mmehie anyị na natachaa mgbaghara Chineke, anyị alọtala na ìgwè-atụrụ nke Chineke anyị bụ́ Onye-Ọzụzụ-Atụrụ n'edú. Kedụ ebe ná ndụ gị ịnà agahièkarị ụzọ? Ó nwerè ike ịbụ na ịnà agbalisí ike ịnọ n'ụzọ Chineke, mana ụfọdụ mmehie ná ndụ gị ana adọkpụ gị ka ịna aga n'ụzọ gasị ndị ahụ n'ekwesịghị ekwesị. Kwupụtara Chineke mmehie ahụ. Chegharịa maka ya ụbọchị taa ma rịọ Chineke ka O nyere gị aka imeri ya n'ụzọ zuru ezù.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nchegharị bụ otu n'ime omume dị mkpa anyị niile nà-eme n'ịmata Kraịst dịka Onye-Nzọpụta anyị. Nchegharị bụ omume anyị ma mgbaghara bụ mmeghachi omume Chineke n'ebe anyị nọ site n'ịhụnanya zuru okè O nwerè n'ebe anyị nọ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise, ị gà-enweta ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ya na obere ihe òfùfè e merè iji nyere gị aka ịghọta nke ọma mkpa nchegharị dị nà njem anyị na Kraịst. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lee www.finds.life.church
More
We would like to thank Life.Church for providing this plan. For more information, please visit: www.life.church