Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị FilipaịIhe Nhụchatụ

Philippians

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ndị Filipaị 4 | Uru Nzuzo Nke Afọ Ojuju

Nnọọ ọzọ na Nkọwa Enyerè Banyere Akwụkwọ Ozi Ndị Filipaị sitere na Through the Word. Kwa ụbọchị, ihe asị gị mee dị mfe:

Nke Mbụ: Gee ya ntị. Pịa kpọọ iji gee ntị na ọdịyo eduziri eduzi nke ụbọchị taa.

Nke Abụọ: Gụọ ya. Gụọ (ma ọ bụ gee ntị na) akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị taa.

Nke Atọ: Bie ya. Chee echiche banyere ihe ị gụrụ wee tinye ya n'ọrụ n'ime ndụ gị ụbọchị taa. Ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị so agụ atụmatụ ihe ọgụgụ a, kekọrịtara nụ onwe unu ihe ndị unu ghọtara na ajụjụ gasị ndị unu nwerè, ma gbaa onwe unu ume ibi kà ndụ, ihe ndị unu mụtara. Ị mechaalá atụmatụ ihe ọgụgụ a! Ugbu a bụ oge ịmalite nke n'eso ya. Through the Word nwerè ọdịyo gasị eduziri eduzi dị nwa obere, nwere nkọwa gasị doro anya maka akwụkwọ ọbụla na isi akwụkwọ ọbụla dị n'ime Akwụkwọ Nsọ! Chọta ihe ndị ọzọ gasị ebe a na YouVersion jirí ngwá ọchịchọ na okwu bụ “Á Kọwarà,” ma ọ bụ lelee ngwá Through the Word iji chọta ọdịyo eduziri eduzi gasị maka akwụkwọ na isi akwụkwọ Akwụkwọ Nsọ ọbụla na throughtheword.org. Hụ na ị so peeji nrụkọ-ọrụ anyị ebe a na YouVersion!

Njem Dị Iri na Itoolu

Ị nwekwarà ike ịgụzụ̀ Akwụkwọ Nsọ dum jirí Through the Word site na iso otu n'ime njem anyị dị iri na itoolu. Kwa njem bụ njegharí jupụtara n'ịtụnanya site na ọtụtụ akwụkwọ Akwụkwọ Nsọ nwere otu ihe jikọtara ha. Ha dị nnọọ ezigbo mma maka ndị otù dị obere ma ọ bụ onye ọbụla chọrọ ịgụzụ̀ Akwụkwọ Nsọ site n'enyemaka nkọwa gasị ka ọ na-agụ ya. Jiri njikọ a malite ugbu a na Njem Nke Mbụ: Njem Nke #1 | Malite

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Philippians

Ọ bụrụ na ị nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ--ebe oké itirì gbara--ma ịnọ n'ime ebe dị otú ahụ n'ihi na e boro gị ebubo mpụ ị n'emeghị, gịnị ka ị ga-akọ na akwụkwọ ozi ịga e zitere ndị enyi gị? Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị ụka Filipaị na-ekpughe mmadụ jupụtara n'ọṅụ--ọbụna na ọ nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ ndị Rom. Akwụkwọ Filipaị bụ akwụkwọ nke ịdị nnukwu ike n'obi na inwe ọṅụ ọbụna mgbe a n'agabiga ọnwụnwa siri ike. Soro Kris Langham mee njem eduziri eduzi n'ime akwụkwọ Filipaị.

More

Through the Word n'emepụta ọdịyo eduziri eduzi gasị dị nwa obere iji nyere gị aka ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ghọta ya, tinye ya n'ọrụ, ma nwee àgwà nke ịgụ ya oge niile. Maka ozi ndị ọzọ, maka nduzi ndị ọzọ banyere Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ inweta ngwá Through the Word, gaa na: http://www.throughtheword.org/