Ndị FilipaịIhe Nhụchatụ

Malite àgwà nke ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ gị ụbọchị taa site na Nkọwa nke Akwụkwọ Ozi Ndị Filipaị! Soro Kris Langham na njem ọdịyo nke nkọwa isi-akwụkwọ-kwa-isi-akwụkwọ nke akwụkwọ ozi dị nnukwu ike Pọl dere gbasara iji obi ike na ọṅụ n'eche ọnwụnwa siri ike ihu. Ị ga-enweta nkọwa doro anya na ụzọ bara uru esi etinye ya n'ọrụ n'ime minit iri kwa ụbọchị ka Pọl n'enyere ndị Kraịst aka ịchọta ọṅụ dị omimi n'abịa site na ihe isi ike a gabigara ọnụ na ozi ejekọtara ọnụ.
Nkọwatú Nke Akwụkwọ Ozi Ndị Filipaị | Anyị N'ejekọ́ Ozi Ọnụ
Nnọọ ọzọ na Nkọwa Banyere Akwụkwọ Ozi Ndị Filipaịsitere na Through the Word. Kwa ụbọchị, ihe asị gị mee dị mfe:
Nke Mbụ: Gee ya ntị. Pịa kpọọ ka igee ntụziaka nke ọdịyo ụbọchị taa.
Nke Abụọ: Gụọ ya. Guo (ma ọ bụ gee ntị na) akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị taa.
Nke Atọ: Bie ya ebie na ndụ gị. Chee echiche banyere ihe ị gụrụ wee tinye ya n'ọrụ na ndụ gị ụbọchị taa. Ọ bụrụ na ndị enyi gị so gị agụ atụmatụ ihe ọgụgụ a, kekọrịtara nụ onwe unu ihe ndị unu ghọtara na ajụjụ gasị unu nwere, ma gbaa onwe unu ume i n'ebí ihe ndị unu mụtara.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọ bụrụ na ị nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ--ebe oké itirì gbara--ma ịnọ n'ime ebe dị otú ahụ n'ihi na e boro gị ebubo mpụ ị n'emeghị, gịnị ka ị ga-akọ na akwụkwọ ozi ịga e zitere ndị enyi gị? Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị ụka Filipaị na-ekpughe mmadụ jupụtara n'ọṅụ--ọbụna na ọ nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ ndị Rom. Akwụkwọ Filipaị bụ akwụkwọ nke ịdị nnukwu ike n'obi na inwe ọṅụ ọbụna mgbe a n'agabiga ọnwụnwa siri ike. Soro Kris Langham mee njem eduziri eduzi n'ime akwụkwọ Filipaị.
More