Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ndị FilipaịIhe Nhụchatụ

Philippians

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Ndị Filipaị 1 | Ibi Ndụ Bụ̀ Kraịst, Ịnwụ Bụ̀ Uru

Nnọọ ọzọ na Nkọwa Enyerè Banyere Akwụkwọ Ozi Ndị Filipaị sitere na Through the Word. Kwa ụbọchị, ihe asị gị mee dị mfe:

Nke Mbụ: Gee ya ntị. Pịa kpọọ ka igee ntị na ọdịyo ntụziaka nke ụbọchị taa.

Nke Abụọ: Gụọ ya. Gụọ (ma ọ bụ gee ntị na) akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị taa.

Nke Atọ: Bie ya na ndụ gị. Chee echiche banyere ihe ị gụrụ wee tinye ya n'ọrụ na ndụ gị ụbọchị taa. Ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị so agụ atụmatụ ihe ọgụgụ a, kekọrịtara nụ onwe unu ihe ndị unu ghọtara na ajụjụ gasị unu nwerè, ma gbaa onwe unu ume ibi na ndụ, ihe ndị unu mụtara.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Philippians

Ọ bụrụ na ị nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ--ebe oké itirì gbara--ma ịnọ n'ime ebe dị otú ahụ n'ihi na e boro gị ebubo mpụ ị n'emeghị, gịnị ka ị ga-akọ na akwụkwọ ozi ịga e zitere ndị enyi gị? Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị ụka Filipaị na-ekpughe mmadụ jupụtara n'ọṅụ--ọbụna na ọ nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ ndị Rom. Akwụkwọ Filipaị bụ akwụkwọ nke ịdị nnukwu ike n'obi na inwe ọṅụ ọbụna mgbe a n'agabiga ọnwụnwa siri ike. Soro Kris Langham mee njem eduziri eduzi n'ime akwụkwọ Filipaị.

More

Through the Word n'emepụta ọdịyo eduziri eduzi gasị dị nwa obere iji nyere gị aka ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ghọta ya, tinye ya n'ọrụ, ma nwee àgwà nke ịgụ ya oge niile. Maka ozi ndị ọzọ, maka nduzi ndị ọzọ banyere Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ inweta ngwá Through the Word, gaa na: http://www.throughtheword.org/