Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

20/20: Ahụrụ. Ahọpụtara. E zipụrụ. Nke Christine Caine Derè Ihe Nhụchatụ

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

A HỤWO, HỌRỌ, MA ZIPỤ ANYỊ. KA ANYỊ GAA!

Gaa nụ n'ime ụwa nile n'agbasanụ Oziọma nye ihe nile ekerè eke. -Mak 16:15 CSB

Itolite dịka ada nke ndị Gris nke ọgbọ mbụ kwagará mbà ọzọ pụtara itolite na mgbakọ na nnọgide ndị Grik. N’ihi na ndị mụrụ m—na ndị enyi ha nile—bịara n’Australia n’enweghị onye ọ bụla ha pụrụ ịdaberè na ya ma e wezụga ibe ha, ha gbakọtarà ọnụ, gbanye mkpọrọgwụ n’echiche bụ́ na e nwerè nchebe na ìgwé mmadụ. Ya merè, n’oge m bụ nwata, nne na nna m na nwanne nna m na ụmụnne m ndị ikwu na ndị enyi na ndị agbata obi ha na-anọnyere onwe ha dị ka o kwerè mee na obodo ejikọtara ọnụ, dịka a ga-asị na ha na-atụ egwù ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha agbasaa. Ọ bụghịkwa n'ihi na ha asụghị Bekee, nne na nna m na-asụ asụsụ ise: Arabic, Greek, French, Italian na English. Ha bụ ndị nwere amamihe! Ha maarà otú e si ejegharị n’ọha mmadụ nke oge a, mana ha họọrọ ibi n’obere ụwa nke ha merè.

Mgbe ụfọdụ, ana m echè na anyị bụ́ Ndị Kraịst nà-akpa àgwà otú ahụ. Anyị na-ebi n'ime mkpuchi nnọkọ na nnọgide Ndị Kraịst, n'ime obodo Ndị Kraịst anyị, n'ime mkpokọta ndị enyi anyị, anyị na-anọgidesikwa ike ebe ahụ. Ikekwe, anyị na-ezo ọbụna n'ebe ahụ, n'ebe a dịka ụzọ omume ihe na obibi ndụ ọzọ nke anyị onwe anyị na-emepụta n'okpuru Iso Ụzọ Kraịst. Anyị na-echepụta ihe anyị cherè bụ eluigwe n'ụwa, anyị na-achụkwa agụụ n'olileanya na ihe niile gà-aga nke ọma ruo mgbe anyị gà-ahapụ ụwa a. Ma kà anyị n'eme ihe a niile, Jizọs ahụla anyị, họrọ anyị MA ZIPỤ ANYỊ N'IME ỤWA imeta ndị na-eso ụzọ. Anyị apụghị ime iwu Ya kachasị ukwuu ihe kachasị oké mkpa nye anyị ma ọ bụrụ na anyị esighị n'ime ebe na ndị anyị jirì kpuchibidó onwe anyị pụta. 

Jizọs azọpụtaghị anyị ka anyị wuo ụzọ ọzọ Ndị Kraịst kwesịrị isi wee n'eme ihe, iji zèré izute ndị na-adịghị kà anyị, na-adịghị eme ka anyị, na-adịghị eche ka anyị, ma ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe ka anyị. Ọ zọpụtaghị anyị ka anyị zoo n'ụwa, zèré ụwa, leghara ụwa anya, tụọ egwù ụwa, kpọọ ụwa asị, maa ụwa ikpe ma ọ bụ kpee ụwa ikpe. O ziterè anyị n'ime ụwa… ime ndị na-eso ụzọ… ka anyị hụ ụwa nke O kerè n'anya otú Ya Onwe Ya si hụ ụwa n'anya nke ukwuu na n'ụzọ dị ike.

“Gaa nụ n’ụwa dum kwusaara ya na ihe niile e kerè eke Oziọma.”

Okwu kacha mkpa n'amaokwu a bụ GAA.

Gaa nụ n'ụwa dum.

Gaa nụ hụ̀ onye furu efu n'anya.

Gaa nụ nwee ọmịiko n’ebe ndị furu efu nọ.

Gaa nụ gwa ndị furu efu banyere Jizọs.

Gaa nụ mee ndị na-eso ụzọ Jizọs.

EKPERE

Nna nke elu-igwe, daalụ na Ị hụrụ m, rọpụta m, ma zipụkwa m. Nyèré m aka inwe ume na obi ike ịga ebe Ị gwara m ka m gaa ma mee ihe Ị kpọrọ m ka m mee. Amen.

Maka ihe ndị ọzọ gbasara nke a gaa hụ www.christinecaine.com/2020study  

E wepụtara ihe ọgụgụ a site na 20/20: Seen.Chosen.Sent nke Christine Caine derè. Ikikere niile banyere ya bụ nke Christine Caine ©2019. Ebigharịrị ya site n'inata ikike nke Lifeway Women. Ikikere niile banyere ihe ọbụla eji ya wee mee dịkwa n'aka ha.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche otú Chineke ihu gị, lekọta gị anya na ghọta gị nke ọma apụghị ma mee ka ibido huwá ndị mmadụ n'ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche na ndụ nkịtị ị n'ebi kwa ụbọchị pụrụ inwe ọkpụrụkpụ mmetụta dị ebighị ebi? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa sí n'aka Christine Caine gà-enyere gị aka ịchọpụta otú Chineke si wee hútá gị, họrọ gị, wee zipụ gị ịga bido hútawá ndị mmadụ ma nyere ha aka ịdị nhútá na nghọta otú Chineke si wee n'ele ha anya—jiri ọhụhụ́ ụzọ dị 20/20.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Christine Caine - A21, Propel, CCM maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.christinecaine.com/2020study