20/20: Ahụrụ. Ahọpụtara. E zipụrụ. Nke Christine Caine Derè Ihe Nhụchatụ

CHINEKE N'AHỤ GỊ
Mana Onye-nwe-anyị ewee sị Samuel: “Elela anya na ka o si jupụta na mmadụ ma ọ bụ n'ogologo dimkpa ya n'ihi na ajụla M ya. Ụmụ mmadụ adịghị ahụ ka M Bụ Jehova si ahụ, n’ihi na ụmụ mmadụ na-ahụ ihe a na-ahụ anya, mana Mụ Bụ Jehova n'ele anya n'obi.” -1 Samuel 16:7 CSB
Na njem mụ ọtụtụ afọ gara aga, agara m iweta kọfị m ga-aṅụ, tutu ezinụlọ m abanye n'ụgbọelu. Nick so ụmụ anyị ndị nwanyị gaa n'ihu iji mee ka ha nọdụ́ n'oche ha. Mgbe m lọghachiri n'ọnụ ụzọ ahụ esi agá ebe ụgbọelu nọ, amalitere m ka m gafee teminal wee rigoro na jet brij, mana otu onye-ọrụ ụgbọelu lere m anya wee sị, “Nwaanyị, Ị gaghị abanye n'ụgbọelu a.”
Nke a gbagwojuru m anya, m wee jụọ ya ihe mere o jiri kwuo ụdị okwu ahụ.
“Ebe ọ bụ na ị nwerè oge iji gaa weta kọfị, ọ pụtara na ị nweghị oge iji wee baa n'ụgbọelu.”
Ihe o kwuru mara m ahụ jijiji. Ahụghị m kwanu amamihe dị n'ihe o kwuru. Amaara m na oge eji abanye n'ụgbọelu agafebeghị, “Ụzọ ụgbọelu ka dị oghere, nwada. Biko nara m akwụkwọ ngafe m ma kwe m ka banye n'ụgbọelu.”
Mana nwada a kwụ chịm n'ihe o kwuru.
“Nwada, di m na ụmụ m nọ n’ụgbọelu a,” a gwara m ya. "Biko kwe m ka m banye."
Nwada a ekweghị imeghari ahụ.
Echetara m ka m si dị ka onye n'enweghị enyemaka, dị mgbagwoju anya, na dị ka onye n'enweghị uru ọbụla ọ bara. Nwada ahụ e gosighị mmetụta ọmịiko chaa n'ebe m nọ, ọ gbasaghí ya ma ọlị na ọ chọrọ ime m nkewapụ n'ezinụlọ m. Ọ nọ n'ele m anya, mana ọ naghị ahụ m.
E mechara m wee banye n'ụgbọelu ahụ, mana echefubeghị m ma ọlị ka nwada ahụ si wee mee m ka obi na ahụ dị m. N'otu aka ahu, àgwà ya ahụ mere ka m hutá ka m si wee n'emeso ndị mmadụ àgwà dị ka ya, karịa ka m si wee n'akpaso ha àgwà ka Jizọs—mgbe m lere anya,manaọ dịghị ihe ma ọ bụ onye m n'ahụ. Lee ka o si diri anyị oké mfe ileghara onye oje-ozi n'ewetara anyị nri n'ụlọ nri, onye n'ehicha ma n'edozi mbọ aka n'ụlọ ịchọ mma ma ọ bụ onye n'achịkọta ma n'ahazi ngwóngwó dị n'ụlọ ahịa. Ọ́ dịghị anyị oké mfe ịkpụnye ihu n'ekwentị mkpanaaka anyị wee hapụ isi obere daalụ nye onye n'ewetara anyị kọfị anyị? Ugboro ole ka anyị bụ ndị na-eleghara ndị ọzọ anya?
Ile anya abụghị otu ihe dị ka ihu ihe. Nwada ahụ nọ́ n'ọnụ ụzọ ụgbọelu lere m anya, mana ọ hụghị m. Anya ya dị m n'ihu, mana ọ dịghị ka ọ hụtara na ọ bụ ghọta ọnọdụ m nke ọma.
Chineke chọrọ ka anyị n'ele anya ma n'ahụkwa! Ọ chọrọ ka anyị na-ahụ ndị ọzọ site na ka O si ahụ ha—karịsịa ma a bịa n’ịhụ ndị n'agafe ụzọ anyị kwa ụbọchị.
EKPERE
Nna M Nke Eluigwe, biko meghee anya nke obi m ka m wee bido hụwa ndị mmadụ ma ghara ileghara onye ọ bụla anya ọzọ. Nyere m aka ime ka ndị gbara m gburugburu dị nhutá, mara na ama ha, na a n'anụ ha, na ha nwekwara ùgwù ma baa uru. Jiri ihe ọmụmụ a gosi m ka m ga-esi eto n'ịhụ ndị ọzọ nke ọma karịa ka m si ahụ na mbụ, ịhụ ha otú Ị si ahụ ha. N'aha Jizọs, amen.
E wepụtara ihe ọgụgụ a site na 20/20: Seen.Chosen.Sent nke Christine Caine. Ikikere niile banyere ya bụ nke Christine Caine ©2019. Ebigharịrị ya site n'inata ikike nke Lifeway Women. Ikikere niile banyere nke a dịkwa ha n'aka.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche otú Chineke ihu gị, lekọta gị anya na ghọta gị nke ọma apụghị ma mee ka ibido huwá ndị mmadụ n'ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche na ndụ nkịtị ị n'ebi kwa ụbọchị pụrụ inwe ọkpụrụkpụ mmetụta dị ebighị ebi? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa sí n'aka Christine Caine gà-enyere gị aka ịchọpụta otú Chineke si wee hútá gị, họrọ gị, wee zipụ gị ịga bido hútawá ndị mmadụ ma nyere ha aka ịdị nhútá na nghọta otú Chineke si wee n'ele ha anya—jiri ọhụhụ́ ụzọ dị 20/20.
More