Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

20/20: Ahụrụ. Ahọpụtara. E zipụrụ. Nke Christine Caine Derè Ihe Nhụchatụ

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Ị BỤ̀ NNU & ÌHÈ

Ị bụ̀ nnu nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu adizighị ụtọ, olee otú a gà-esi mee ka ọ dị nnu? Ọ dịghịzi mma makà ihe ọbụla, agà atupu ya n'ezi ebe aga azọ ya ukwu. Ị bụ̀ ìhè nke ụwa. A pụghị izo obodo guzoberé n'elu ugwu, ezo. Ọ dịghị onye n'amunye oriọna wee debe ya n'okpuru nkata, kama ana edeba ya n'ihe ndobe oriọna o wee nye ìhè n'ime ụlọ nile -Matiu 5:13-15 CSB

Abụ m nwa akwụkwọ kọleji mgbe m merè enyi nke dịka o nwezurù ihe niile— mma, akara ule, mmezù n'elemanya nke ụwa, akụ na ụba. Ihe niile m cherè na enweghị m. N'agbanyeghị nke ahụ, anyị jikọrọ ọnụ n'otu. Mana, mgbe o furu efu ruo ụbọchị atọ ma amaghị m ebe ọ gara, ọ zaghịkwa ekwenti ya, ụjọ tụrụ m n'ezie. Mgbe o mecharà pụta n'ụzọ tụrụ m n'anya n'ụbọchị nke atọ, achọpụtara m na ọ nọwo na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ebe ihe ka ọtụtụ ndị mmadụ na-aṅụ ọgwụ iji mụrụ anya. Ọ sịrị m, “Enwetarà m ịhụnanya dị ukwuu ebe ahụ m gara. Enwetarà m nnukwu ọṅụ. E nwetarà m udo dị ukwuu nke juru m isi na ahụ.” Ka o kwucharà nke a, o wepụtara mpempe flawa wee si m "Ahụmahụ m nwerè tobigarà m oké ụtọ, Chris, m wee chọọ ka inwetakwa ya, ya merè m jirì wetara gị mpempe nke a." 

Ajụrụ m ị nara mkpụrụ ọgwụ ahụ o cherè n'ihu m, mana ihe a gbagwojuru m anya. Naanị afọ ole na ole gara aga ka m nyerè Jizọs ndụ m n’ụzọ zuru ezu, m wee n'eche, sị, Nwa agbọghọ a hụrụ m n’anya nke ukwuu, na ọ chọghị ka ịhụnanya na ọṅụ na udo o nwerè site na mkpụrụ ọgwụ ahụ gabiga m. Mana mụ, bụ Christine, nwerè Mmụọ Nsọ nke Chineke bi n’ime m, Onye bụ isi iyi nke ịhụnanya na ọṅụ na udo. Christine, ihere na-eme gị nke ukwuu ikwu banyere Chineke, n’ihi na i cherè na ọ dịghị nwa agbọghọ a mkpa, mgbe otu ihe kacha mkpa ka o nwete na ndụ ya bụ̀ Chineke.

Mgbe m checharà nke a, e berè m ákwá. Ekwere m Chineke nkwa na agaghị m ekwe ka mmasị onye ọbụla nwerè banyere ihe ọ bụla— ọgwụ, ego, ihe ịga nke ọma ma ọ bụ ọbụna ihe kpatara ya— dị elu karịa ịhụnanya m nwerè n’ebe Chineke nọ na njikere m ịpụ gwa ndị mmadụ banyere Onye Ọ bụ̀. 

Gịnị kpatara na anyị na-aghọta ngwa ngwa ndị ndụ ha mebiri emebi dị ka ndị kwesịrị nduzi, ma ghara ịghọta na ọbụna ndị yiri ka ha nwerè ihe niile nwekwara ike ịbụ ndị furu efu na ndị nduzi dịkwa mkpa? Ọ́ bụghị na Chineke chọrọ ka anyị ghọta na ndị furu efu yikwarà mmadụ niile? 

Kemgbe ụbọchị ahụ, echefughị ​​m na e nwerè ogheré agụụ na mmasi nke Chineke na ihe Ya n’obi mmadụ ọ bụla, nke nanị Jizọs pụrụ imeju, nakwa na onye ọ bụla kwesịrị ịnụ banyere Ya. 

EKPERE

Chineke, nyèré m aka ịbụ nnu na ìhè n’ebe ọ bụla m nọ, na nye onye ọbụla na-agakwuru m na onye ọ bụla m zuterè. Nyèré m aka ile anya na ịhụ… ndị gbajiri agbaji na ndị furu efu... n'agbanyeghị otú ha si pụta ma ọ bụ dị. Nyèré m aka inwe ọmịiko na obi ike irute ma dọta ndị mmadụ nso Gị taa. N’aha Jizọs, ana m ekpe ekpere, amen.

E wepụtara ihe ọgụgụ a site na 20/20: Seen.Chosen.Sent nke Christine Caine derè. Ikikere niile banyere ya bụ nke Christine Caine ©2019. Ebigharịrị ya site n'inata ikike nke Lifeway Women. Ikikere niile banyere ihe ọbụla eji ya wee mee dịkwa n'aka ha.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche otú Chineke ihu gị, lekọta gị anya na ghọta gị nke ọma apụghị ma mee ka ibido huwá ndị mmadụ n'ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche na ndụ nkịtị ị n'ebi kwa ụbọchị pụrụ inwe ọkpụrụkpụ mmetụta dị ebighị ebi? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa sí n'aka Christine Caine gà-enyere gị aka ịchọpụta otú Chineke si wee hútá gị, họrọ gị, wee zipụ gị ịga bido hútawá ndị mmadụ ma nyere ha aka ịdị nhútá na nghọta otú Chineke si wee n'ele ha anya—jiri ọhụhụ́ ụzọ dị 20/20.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Christine Caine - A21, Propel, CCM maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.christinecaine.com/2020study