Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

20/20: Ahụrụ. Ahọpụtara. E zipụrụ. Nke Christine Caine Derè Ihe Nhụchatụ

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

KA ANYỊ HỤ NDỊ AGBATA OBI ANYỊ N'ANYA

Mgbe ahụ, otu ọkà mmụta iwu bilirì iji nwalee Ya [Jizọs], sị: “Onye Ozizi, gịnị ka m gà-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” "Gịnị ka e derè n'iwu?" Ọ jụrụ ya. "Kedụ ka ị si gụọ ya?" Ọ zara, sị: “Jìrí obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum na uche gị dum hụ Onye-nwe-anyị bụ́ Chineke gị n’anya,’ na 'hụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ọ gwara ya, sị: “Ị zara nke ọma. Mee nke a, ị ga-adị ndụ." Ma n'ihi na ọ chọrọ igosi onwe ya ka onye ezi omume, ọ jụrụ Jizọs, “Ònyé bụ̀ onye agbata obi m?” -Luk 10:25-29 CSB

Akụkọ banyere ezi onye Sameria bụ ilu Jizọs tụrụ banyere otu nwoke nọ n’ebe n'ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị, ndị ohi wakporò, tie ihe nke fọdụrụ nwa obere ka ọ nwụọ, buru ngwongwo ya wee tụpu ya n'akụkụ okporo ụzọ wee gbalaga.

Dịka akụkọ ahụ si gaa, onye mbụ na onye abụọ bịakwasịrị nwoke ahụ bụ̀ ndị okpukpe— onye nchụàjà bụ́ onye Juu na onye Livaị bụ́ onye maara okwu Chineke ma nwee ikike okpukpe n’ụlọ nzukọ— ha abụọ gafere nwoke ahụ. Mgbe onye nke atọ bịakwasịrị nwoke ahụ, omịiko nuputarà ya n'obi, ya bụ́ onye na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, onye Sameria. Ọ gakwurulà nwoke ahụ ka ọ tọgbọ ebe ahụ.  

Ha mmadụ atọ na-aga ebe dị ha mkpa, mana ọ bụ naanị otu n'ime ha kwụsịrị, naanị otu onye dị njikere ikwụsị ịhapụ ihe dị ya mkpa, họrọ mmekpe ahụ na nsogbu nke inye aka, naanị otu onye nyerè oge ya na ihe onwunwe ya maka inye aka. Onye a bụ̀ onye Sameria— onye siteré n’agbụrụ na omenala ndị Juu na-eledà anya. Nwoke a hụrụ n'anya dị ka Chineke sị ahụ n'anya, na-emebi ihe mgbochi nke ajọ mbunobi na ịkpa ókè. Ọ huru mmadụ-ibe-ya n'anya dịka onwe-ya. 

Mgbe Jizọs kọcharà akụkọ a, O nyerè ntụziaka: “Gaa nụ mee otu ihe ahụ” (Luk 10:37).

Oge izizi m maarà maka ịzụ ahịa na orire mmadụ, Chineke ji akụkọ a duzie m n'ọdịnihu m. O merè otu okwu a ka o sie ike n'ime m: “Ọ gakwuurù Ya” (Luk 10:34).

Abụ m nwanyị ji ọrụ n’aka, nwunye, nne nke ụmụ abụọ, enwerè m ọtụtụ ihe ime, mana Chineke chọrọ ịkwụsị kà ndụ m na atụmatụ m sì aga maka nzube Ya. Chineke chọrọ ka m gafee n'okporo ụzọ ọzọ maka ndị m na-ahụtụbeghị mbụ, ndị mụ amaghịkwa na ha dị. Ọ chọrọ ka m gaa chọta ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka ndị furu efu, ndị atọrọ̀ atọ̀ n'ịbụ ohu nke oge a. 

Ònyé bụ̀ onye agbata obi gị? Ndị m nà-ezute na chọọchị bụ ndị agbata obi m. Nwanyị bi n’ofe okporo ụzọ bụ onye agbata obi m. Onye na-enweghị ebe obibi bụ onye agbata obi m. Onye chọrọ ihe m nwerè ike inye bụ onye agbata obi m.

Ọ bụrụ na anyị gà-erute ụwa anyị, anyị kwesịrị ịhụ na onye ọ bụla bụ onye agbata obi anyị. Onye ọ bụla kwesịrị ka anyị hụ ha n'anya n'agbanyeghị nkwenye ha, omume ha ma ọ bụ àgwà ha, n'ihi na Chineke na-ahụ ha dị ka ndị a hụrụ n'anya na ndị a pụrụ ịgbapụta site n'amara Ya. 

EKPERE

Chineke, m na-ahọrọ ịgafetè n'ụzọ nke ọzọ Gị, inyere ndị agbata obi m aka, ịhụ ha n'anya dị ka m hụrụ onwe m n'anya. Daalụ maka Ị na-akpali m mgbe niile, ná enyere m aka icheta na ọrụ m adịghị oké mkpa karịa inyere ha aka, n’aha Jizọs ka m na-ekpe ekpere, Amen. 

E wepụtara ihe ọgụgụ a site na 20/20: Seen.Chosen.Sent nke Christine Caine derè. Ikikere niile banyere ya bụ nke Christine Caine ©2019. Ebigharịrị ya site n'inata ikike nke Lifeway Women. Ikikere niile banyere ihe ọbụla eji ya wee mee dịkwa n'aka ha.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

20/20: Seen. Chosen. Sent. By Christine Caine

Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche otú Chineke ihu gị, lekọta gị anya na ghọta gị nke ọma apụghị ma mee ka ibido huwá ndị mmadụ n'ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche na ndụ nkịtị ị n'ebi kwa ụbọchị pụrụ inwe ọkpụrụkpụ mmetụta dị ebighị ebi? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa sí n'aka Christine Caine gà-enyere gị aka ịchọpụta otú Chineke si wee hútá gị, họrọ gị, wee zipụ gị ịga bido hútawá ndị mmadụ ma nyere ha aka ịdị nhútá na nghọta otú Chineke si wee n'ele ha anya—jiri ọhụhụ́ ụzọ dị 20/20.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Christine Caine - A21, Propel, CCM maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.christinecaine.com/2020study