Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Oge Gị Ruorá Chineke ỌrụIhe Nhụchatụ

Using Your Time for God

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Ịtọ̀ Kà Ị Sì Ème Ihe

Jìrí oge iji eme ntụrụndụ mee ihe maka nchuso gasị ná-akwalité ogo mma nke ndụ gị. Ịgụ akwụkwọ bụ̀ ihe bara uru a pụrụ iji oge eme. Ọgọstin n'otu oge nyerè ndị kwere ekwe ndụmọdụ ka ha mụta ọtụtụ ihe ka o kwerè ha, ebe ọ bụ̀ na eziokwu niile bụ̀ eziokwu Chineke. Ihe ndị ọzọ na-akwalite kwa ogo mma ndụ bụkwa na mpaghara nke nkà gasị. Ime ihe egwuregwu nke ntinye-na-ngú okwu pụ́rụ́ ịdị́ mgbagwoju anya n'atọkwa m ụtọ, m wee n'eji ya n'eme ka ụbụrụ isi m nọgide n'enwu ọkụ nakwa n'eme ka okwu ndị m maarà n'abawanye.

Chọta ụzọ gasị iji merie ihe ahụ n'eri oge gị kwa ụbọchị "site n'ụra." Ihe m na-emekarị bụ ịlakpụ́ ụra n'etiti elekere asatọ na itoolu nke abalị. Ma tété ka ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ. Nke a emeela kà ka m si eme ihe gbanwee n'ụzọ magburu onwe ya. Ụ̀zụ ụzụ́ ụtụtụ enweghị mkpọtụ ma ọ bụ ihe ndị na-adọpụ uche, oge magburu onwe ya maka ịmụ ihe, ide ihe, na ikpe ekpere.

Jìrí oge iji anya ụgbọala gị mụọ ihe. Inyà ụgbọala bụ ihe anyị n'eme n'enye anyị ohere uche anyị ịdị n'ihe n'eme gburugburu anyị karịa na naanị n'ihe n'eme n'okporo ụzọ ụgbọala ahụ anyị nà-anyà.

Ihe ikpeazụ, ọtụtụ oge, ụzọ ị kwadeberè ka ijí n'eme ihe dị̀ nwere-onwe karịa ịdị mkpachi. Ijí ụzọ akwadeberè eme ihe n'enye aka n'ụzọ dị ukwuu ịhazi kà anyị si eji oge anyị eme ihe. Ụzọ i kwadeberè isi eme ihe kwesịrị ịbụ enyi gị, abụghị onye iro gị. Ọ n'enyere anyị aka ịchọta ọmarịcha usoro ime ihe maka ndụ bara uru, n'enye Chineke otuto.

Coram Deo: Ibi Ndụ N'ihu Chineke

Ọ bụrụ na ịnweghị ụzọ ị kwadeberè ka isi eme ihe, mepụta otu wee ji ya mee ihe izu dum, ma tụlee otú o siri nyere gị aka gbapụta oge gị. Ọ bụrụ na ị nwererị̀ ụzọ ị kwadeberè ka isi eme ihe, wepụta nwa oge nyochaa ya ma kpee ekpere banyere ihe ndị iji kpọrọ ihe n'ime ya.

Copyright © Ligonier Ministries. Nwèté akwụkwọ dị akwughị ụgwọ sitere n'aka R.C. Sproul na Ligonier.org/freeresource.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Using Your Time for God

Ihe òfùfè dị ụbọchị anọ siteré n'aka R. C. Sproul maka iji ndụ gị meere Chineke ihe. Kwa ihe òfùfè n'akpọ gị òkù ka ị bie ndụ gị nà ọnụnọ nke Chineke, n'okpuru ikike Ya, n'enye Chineke otuto niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ligonier Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na Ligonier.org/youversion