Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Oge Gị Ruorá Chineke ỌrụIhe Nhụchatụ

Using Your Time for God

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

Ịgbapụtà Oge Gị

Oge bụ ihe n'eme ka mmadụ niile na ihe niile hàrá otu nha. Ọ bụ otu akụ e nyerè kpọmkwem n'ogo dị otu. Ọ dịghị mmadụ ọbụla dị ndụ e nyerè awa ole karịa ibe ya ka o ji wee mee ihe kwa ụbọchị. Ndị si na ha adịghị enwe éfè adịghị enweta mgbakwunye awa na nke enyerè ha kwa ụbọchị. Ọ dịghị onye elekere ma ọ bụ ihe ngú oge hụrụ n'anya karịa ibe ya.

Anyị niile nwerè otu nha na oge kwa ụbọchị. Ebe anyị si dị iche n'ibe anyị bụ̀ ka anyi si agbapụta oge e kenyerè anyị. Mgbe agbapụtarà ihe, ana anapụta ya ma ọ bụ zupụta ya site n'ime ọnọdụ n'adịghị mma. Ọnọdụ n'adịghị mma anyị n'elekwasị anya ebe a bụ̀ ọnọdụ mmefù. Imefù oge bụ iji ya mee ihe n'enweghị uru ọbarà ma ọ bụ ihe uru ya dị obere.

Vince Lombardi nwụrụ́ anwụ́ bụ̀ onye kwuru okwu a ámà àmá, "Ọ dịghị mgbe m funahụrụ ihe egwuregwu ọbụla; ọ nà oge gwụnàhụrụ̀ m." Nkọwa a nà-arụtụrụ m aka ná ihe kasị atụ anya n'ihe egwuregwu—mgba ọsọ megide ihe eji agụ oge. Otù kachasị mee ihe bara uru n'oge enyerè ha bụ otù n'emeri n'ihe egwuregwu. Ka ana ahụ, n'ihe egwuregwu, n'adịghị ka ndụ anyị n'ebi, enwerè ohere gasị maka ịkpọ òkù si na ozuola, ka akwụsịtụ ihe a n'eme. A pụrụ ịkwụsịtụ ngú oge nke elekere n'asọmpi ihe egwuregwu ọbụla a n'eme. Mana na ndụ anyị n'ebi nke a hụrụ anya, ọ dịghị nkwụsịtụ oge ọbụla dịnụ.

Coram Deo: Ibi Ndụ N'ihu Chineke

Rịọ Chineke ka O kpugheere gị ụzọ gasị i pụrụ ịgbapụtà oge ana emefù n'ihe ndị na-abaghị uru ma ọ bụ n'ihe ndị uru ha dị nwa obere.

Copyright © Ligonier Ministries. Nwèté akwụkwọ dị akwughị ụgwọ sitere na R.C. Sproul na Ligonier.org/freeresource.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Using Your Time for God

Ihe òfùfè dị ụbọchị anọ siteré n'aka R. C. Sproul maka iji ndụ gị meere Chineke ihe. Kwa ihe òfùfè n'akpọ gị òkù ka ị bie ndụ gị nà ọnụnọ nke Chineke, n'okpuru ikike Ya, n'enye Chineke otuto niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ligonier Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na Ligonier.org/youversion