Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Iji Oge Gị Ruorá Chineke ỌrụIhe Nhụchatụ

Using Your Time for God

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

Iji Oge Gị Eme Ihe N'ụzọ Bara Uru

Mgbe m bụ̀ nwata nọ n'ụlọ akwụkwọ elementrị, ndị mmadụ nà-ajụkarị m, "Gịnị bụ̀ ihe ị nà-agụ n'ụlọ akwụkwọ kachasị amasị gị?" N'etinyeghị oké echiche na ya, azịza m nà-abụkarị otu n'ime ihe abụọ ndị a. Ana m aza, "egwuregwu" ma ọ bụ "mgbatị ahụ na ákwárà." Azịza m kpugherè ihe ndị kacha amasị m dí n'ime ime obi m. Ahụrụ egwuregwu n'anya ma kpọọ ịrụ ọrụ asị. N'ezie, ajụjụ m gasị n'etó etó banyere "ihe ndị kpatara" anyị ji ebi ndụ otù a n'èmé ka m n'abịa akwụkwọ n'egwú egwuregwu n'ụzọ dị ogologo, na-eje ije ka m nọ n'elu oké eriri ndị ama egwuregwu ihu ọchị ana akpọ circus n'èmé.

Ajụrụ m onwe m ihe ndụ pụtara ebe m n'eji ụbọchị ise n'izu n'eme ihe ndị m n'achọghị ime ka m wee naanị gwuo egwú na ngwụcha izu. Ana m anọkari n'ụlọ akwụkwọ m otu awa zuru ezù tupu amalite ime ihe ọbụla—abụghị na agụmakwụkwọ atọ́gbuola m, kama ọ bụ ka m "gbapụta" oge ịta ahụhụ m n'ihe ana eme n'ụlọ akwụkwọ site n'igwu egwuregwu ga-eju m afọ n'otu awa n'ama egwuregwu ụlọ akwụkwọ m, tupu akuo mgbịrịmgba mmalite omume ihe n'ụlọ akwụkwọ. Nye m, mgbapụta oge pụtara ịnapụta minit gasị dị oké mkpa maka egwuregwu site na awa gasị ana àmányé m ka m ruo ọrụ.

Abịala m ghọta na mgbe Pọl Onyeozi gbarà ndị n'agụ akwụkwọ-ozi ya gasị ume ka ha "(gbapụta) oge, n'ihi ụbọchị gasị dị njọ" (Ndị Efesọs 5:16), ihe ndị ahụ m n'eme abụghị ihe o bù n'uche. Ihe ọ n'ekwu bụ ọkpụkpọ-òkù dị nsọ anyị iji oge anyị n'ụzọ bara uru n'arụ ọrụ n'ime alaeze Kraịst.

Coram Deo: Ibi Ndụ N'ihu Chineke

Ịnà eji oge gị eme ihe n'ụzọ bara uru maka alaeze Chineke?

Copyright © Ligonier Ministries. Nwèté akwụkwọ dị akwughị ụgwọ sitere na R.C. Sproul na Ligonier.org/freeresource.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Using Your Time for God

Ihe òfùfè dị ụbọchị anọ siteré n'aka R. C. Sproul maka iji ndụ gị meere Chineke ihe. Kwa ihe òfùfè n'akpọ gị òkù ka ị bie ndụ gị nà ọnụnọ nke Chineke, n'okpuru ikike Ya, n'enye Chineke otuto niile.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ligonier Ministries maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na Ligonier.org/youversion