Iji Oge Gị Ruorá Chineke ỌrụIhe Nhụchatụ

Imeri Elekere Ma Ọ Bụ Ihe Ngú Oge
Amụtawo m ụfọdụ ụzọ m pụrụ isi merie elekere ma ọ bụ ihe ngú oge. Ha pụkwarà ịdị uru nye gị.
A ghọtarà m na oge m niile bụ̀ oge Chineke nakwa na oge m niile bụ oge m site na nyé Ya. Ọ bụ̀ Chineke nwe m na oge m. N'agbanyeghị nke ahụ, O nyewo m nha oge nke m nà-achịkwa n'elu ya. A pụrụ m iji oge ahụ ruora ndị ọzọ ọrụ, gaa leta ndị mmadụ, wdg., mana ọ bụ oge m gà-enyeriri akaụntụ ka m si wee ji ya mee ihe.
A pụrụ ịgbapụtà oge site nà nlekwasị anya dị ike na enweghị ndopu-uche. Otu ụzọ akachasị emefù oge bụ n'ime uche mmadụ. Aka anyị nwerè ike n'arụ ọrụ mana uche anyị nwerè ike ọ dịghị ihe bara uru ọ na-arụpụta. N'ụzọ ọzọ, aka anyị nwerè ike itọgbọrọ chakoo mana uche anyị ana agbakasi ebe niile. Ime mkpaghari nzuzu n'ime uche anyị, itinyè uche n'ihe na-abaghị uru n'oge anyị mụ̀ anya, na ichè echiche banyere ihe ụtọ dị ibèribè bụ ụzọ gasị a pụrụ isi mefuo echiche gasị n'oge Chineke kenyerè anyị. Idebe uche anyị n'ọrụ dị mkpa anyị n'arụ—jírí nlekwasị anya dị ike—n'eme ka anyị jiri oge anyị rụpụta ihe bara uru.
Uche anyị nwerè ike ịgbapụta oge bara uru ihe ndị gasị dị nkịtị ana-eme ma ọ bụ ihe ndị ana ejighị oké uche eme wèrèlà. Dịka ọmụmaatụ, isa ahụ abụghị ihe eji oké uche eme. Ka a n'eme ya, uche anyị dị̀ na nwe ohere maka itule na gboo mkpa, ichè echiche bara uru apụrụ iji mezie na rụpụta ihe, ma ọ bụ mgwakọtá ihe dị iche iche n'ụzọ mara mma. Echepụtarà m ọtụtụ ozizi m na nkụzi m n'oge m na-asa ahụ. N'oge m ka n'akụsi gọlfụ ike, achọpụtara m na oge ndị o weerè m ịkwadebe na dị njikere maka ịkụ otu shọtụ̀ na ibe ya bụ ezigbote oge mara mma maka mụ ịchịkọta na hazie ozizi gasị n'ime uche m.
Coram Deo: Ibi Ndụ N'ihu Chineke
Kpachara anya ebe ịna edekwasị uche gị ụbọchị taa. Gbalịa ịgbapụtà oge bara uru ihe ndị gasị dị nkịtị ana eme ma ọ bụ ihe ndị ana ejighị oké uche eme wèrèlà site n'iche echiche banyere ihe ndị nwere uru ebighị-ebi.
Copyright © Ligonier Ministries. Nwèté akwụkwọ dị akwughị ụgwọ sitere na R.C. Sproul na Ligonier.org/freeresource.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè dị ụbọchị anọ siteré n'aka R. C. Sproul maka iji ndụ gị meere Chineke ihe. Kwa ihe òfùfè n'akpọ gị òkù ka ị bie ndụ gị nà ọnụnọ nke Chineke, n'okpuru ikike Ya, n'enye Chineke otuto niile.
More