Logo YouVersion
Îcone de recherche

JỌN 1

1
1Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. 2Onye ahu na Chineke diri na mbu. 3Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya. 4Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu. 5Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya. 6Otù nwoke putara, onye ezitere site n'ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn. 7Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n'aka-ya kwere. 8Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà. 9Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè. 10Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya. 11Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya. 12Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: 13ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke. 14Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu. 15Jọn nāb͕ara Ya àmà, nēti kwa nkpu, si, Onye a bu Onye m'kwuru okwu bayere Ya, si, Onye ahu Nke nābia n'azum aghọwo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 16N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara. 17N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia. 18Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.
19Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye? 20O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu. 21Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è. 22Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? ka ayi we nye ndi zitere ayi ihe-ọziza. Ì si gini bayere onwe-gi? 23Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru. 24Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n'etiti ndi-Farisi. 25Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu? 26Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n'etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi, 27bú Onye ahu Nke nābia n'azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya. 28Emere ihe ndia na Betani n'ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism.
29N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa! 30Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 31Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n'ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism. 32Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n'elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n'aru Ya. 33Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism. 34Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.
35Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya; 36o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke! 37Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus. 38Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi? 39Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri. 40Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon. 41Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). 42O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).
43N'echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som. 44Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n'obodo Andru na Pita puta. 45Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef. 46Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le. 47Jisus huru Nataniel ka ọ nābiakute Ya, O we kwue okwu bayere ya, si, Le, onye Israel n'ezie, onye aghughọ nādighi ya n'aru! 48Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n'okpuru osisi fig, ahurum gi. 49Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel. 50Jisus zara, si ya, N'ihi na M'siri gi, Ahurum i n'okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? i gāhu ihe kariri ihe ndia uku. 51Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.

Sélection en cours:

JỌN 1: IGBOB

Surbrillance

Partager

Copier

None

Tu souhaites voir tes moments forts enregistrés sur tous tes appareils? Inscris-toi ou connecte-toi

YouVersion utilise des cookies pour personnaliser votre expérience. En utilisant notre site Web, vous acceptez l'utilisation des cookies comme décrit dans notre Politique de confidentialité