Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Isii Nke Aha Ndị Nke ChinekeIhe Nhụchatụ

Six Days Of The Names Of God

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

ỤBỌCHỊ NKE ISII: EL SIMCHATH GILI – CHINEKE NKE OKÉ ỌÑỤ M

Chee echiche banyere ọṅụ ịnwetara mgbe ị mụtaziri ihe na nke mbụ ya. Ikekwe ị mụtara asụsụ mba ọzọ nke ọma nke mere ka ị nwee ike gị na ndị na-asụ asụsụ mba ahu n'ekwụrịta okwu. Ma ọ bụ na igbaliri ike gi niile n'ogologo ọsọ ana akpọ maratọn wee mechaa gafee akara ngwụcha ya bu ọsọ. Ikekwe, ị na-agbalịsi ike rụọ ọtụtụ afọ iji nweta akara ugo mmụta mahadum gị, ma gi mechaa rịgoro na ọkwa ahụ wee nata ya bụ diplọma. Ị na-enwe mmetụta dị iche iche n'ime ime uche gi, mana ọñụ na-adịkari n'ihu mgbe niile.

Ihe ọma niile sitere na Chineke, Ọ na-añụrịkwa ọṅụ n’ihe niile ziri zi. Obu Ya bụ naanị ma ezi isi iyi nke ọṅụ, ma mgbe anyị tụkwasịrị Ya obi, anyị nwere ike nwe ahụmahụ ọñụ n'ọnọdụ anyị niile. Anyị nwere ike inwe ọñụ n’etiti mgba, ma ọbụrụ na olile-anya anyị dị n’ime Onye-nwe-anyị.

Mmehie anyị na-emekarị bụ ịchọ ọñụ na-abụghị site na Chineke. Mgbe anyị ji echiche onye ọzọ banyere onwe anyị kpọọ onwe anyị ihe ma ọ bụ jiri ụgwọ ọnwa anyị na-akpata ma ọ bụ jiri otụ ọnọdụ ọkwa anyị si dị n'oha, anyị na-atụfu ezi ọñụ. Anyị na-atụfu ọñụ di n'ime njem ahụ, ọñụ nke nchọpụta, ọn̄ụ nke obi ghere oghe nye Chineke. Anyị na-atụfukwa ohere dị egwu maka ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ọñụ nke Onye-nwe-anyị. Ma mgbe anyị jupụtara n'ọñụ nke si n'aka Chineke, anyị na-amụkenye ịhụnanya na obi ụtọ nye ndị gbara anyị gburugburu ma mara ezi ọñụ.

Ọ bụrụ n’ịhụtara usoro ofufe a dika ịhe bara ụrụ, anyị chọrọ inye gị onyinye mbụdata okwuchukwu dị n’aha Jehọva Jireh. Rịọ n'uju okwuchukwu nke Tony Evans ebe a.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Six Days Of The Names Of God

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ó kpụgheworó anyị ihe ndị dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ nà-egọsi ihe karịrị iri asatọ bụ́ aha Chineke dị iche iche. E nyerè ebe a aha isii na ihe ha pụtarà iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Otu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Ihe Òfùfè Na-Enye Ndụ, nke Dr. Tony Evans derè. Eugene, OR: Harvest House Publishers, 2017.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Urban Alternative na Tony Evans maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na https://tonyevans.org/