Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụbọchị Isii Nke Aha Ndị Nke ChinekeIhe Nhụchatụ

Six Days Of The Names Of God

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

ỤBỌCHỊ NKE ATO: JEHOVAH JIREH – JEHOVA GA-ENYE

Ị jighị n'aka otu ị ga-esi akwụ ụgwọ gị n'ọnwa a. Ọnọdụ mmekọrịta gị na onye ihụrụ n'anya dị n'elu ka ikuku. Ị nụla na mbelata ọrụ na-abịa n'ebe ọrụ gi, ma ijighi ọnọdụ gị n'ime ụlọ ọrụ gi n'aka. Mgbe ihe ndị bụ́ isi ná ndụ nọ n’ihe ize ndụ—ahụ ike, ego, ebe obibi, nri, ezinụlọ, ọrụ—ọ bụghi ihe itunanya ma ọbụrụ na egwu bidọrọ tuwa gi, dị ka à ga-asị na ọ nweghị ebe ị ga-agbaba. Ọ bụ mgbe ahụ ka i kwesịrị ịkpọkụ Jehọva Jireh. Aha Chineke a agọziri agọzi pụtara “Onye-nwe-anyị ga-enye,” nakwa ọ bụ aha jụpụtara n’iké na ikikeré.

Mgbe anyị na-atụ ụjọ maka ọdịnihu anyị, ọ dị mkpa ka anyị tụgharia ebe Chineke nọ ma kpọkuo aha Ya. Onyinye ọma na nke zuru oke n'esite na Ya abịa, ma enweghị ogige agbara onyinye na ngọzi Ọ na-enye. Ịtụkwasị okwukwe anyị na Ya mgbe ụfọdụ pụrụ ịbụ nanị ụzọ anyị ga-esi mee ka egwu anyị dajụọ ma mee ka anyị nọgide n'ezi uche.

Ọ pụrụ ịbụ ihe mmụta siri ike ịmụta, mana ọnwụnwa ndị ana-enwe n’ụwa a na-ewusi akwara ime mmụọ anyị ike ma na-adọta anyị nso na Chineke. Site na mgba anyị, Ọ na-egosi anyị n'onwe anyị ka Ọ si enye ngụgụ anyị ikuku iji wee kụọ ume na ìhè ka anya anyị ji wee hụ uzo. Ọ na-enye anyị kpọmkwem ihe dị anyị mkpa iji wee wepụta ụtọ kacha ukwụụ n'ime anyị na mmetụta kachasị nke niile maka alaeze Ya. Ọ na-enyekwa ya mgbe niile n'ime mmụọ nke ịhụnanya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Six Days Of The Names Of God

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ó kpụgheworó anyị ihe ndị dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ nà-egọsi ihe karịrị iri asatọ bụ́ aha Chineke dị iche iche. E nyerè ebe a aha isii na ihe ha pụtarà iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Otu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Ihe Òfùfè Na-Enye Ndụ, nke Dr. Tony Evans derè. Eugene, OR: Harvest House Publishers, 2017.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Urban Alternative na Tony Evans maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na https://tonyevans.org/