Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ubọchi Isii Nke Aha Ndi Nke ChinekeIhe Nhụchatụ

Six Days Of The Names Of God

ỤBỌCHỊ 5 NKE 6

ỤBỌCHỊ NKE ISE: ELOHE TSADEKI – CHINEKE NKE EZI OMUME M

Anyị na-achọkarị ihe nnukwu ọzọ. Ihe nzụzọ maka nhazi. Isi ihe iji nweta ahụ di nma ile anya. Atụmatụ n'enweghi mgbagọ iji nwee nkwụsi ike maka ego anyi ji ebi ndụ. Anyị na-agụ akwụkwọ, na-ege pọdkastị ntị na-edebanye aha anyi maka nzukọ ọmụmụ. Asighi na nhazi, ahụike anụ ahụ na nchekwa ego abụghi ihe niile kwesịrị ekwesị nchụso, mana anyị kwesịrị ijide n'aka na anyị anaghị efụnarụ ihe nke bụ isi okwu mgbe anyị na-achọ ihe nnukwu ọzọ.

Isi ihe nke ndụ bụ iso Chineke, ịdị ka Ya na ibi ndụ anyị maka Ya. Ma ịdị ka Chineke pụtara ito eto n'ịdị mma na ezi omume. Site n'ebe Onye-nwe-anyị nọ bu ebere, amara, idi dimkpa na idi ike—bụ àgwà niile anyị chọrọ na-ndụ anyị nakwa n’ime ụwa anyị. Chineke na-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa site n’okwu Ya na mmụọ Ya ka anyị bie n’ụba ọṅụ. Mgbe anyị na-ahọrọ ọchịchọ Ya karịa nke anyị ma na-agbalịsi ike ịdị ka Ya, Ọ na-edụzi ma na-atụziri anyị.

Ịsoro atụmatụ Chineke nwere ike bụrụ ihe siri ike karịa ịrapagidesi ike n'usoro isii dị mfe iji nweta ahụ di nma ile anya ma ọ bụ ụzọ iri ị ga-esi gbụtụọ ihe ndi n'abaghi uru n'ime ụlọ gị. Mana ọ na-akwụghachikwa ụgwọ karịa. Mgbe anyi n'echegara Chineke ihụ anyi ma nyefee ndụ anyị n'aka Ya, Ọ na-agbaghara anyị ma na-enye anyị nnukwu obi ebere Ya dika onyinye. Ọ na-enyere aka mezie mmekọrịta anyị na ndi mmadu mebiri emebi ma mee ka obi anyi jụpụta n'ezi omume, amara na udo. Ezi mkpụrụ na-apụta site n'iso Chineke na ikwe ka ezi omume Ya na-edụzi nzọmụkwụ anyị.

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Six Days Of The Names Of God

Site n'ọtụtụ aha Chineke, Ọ kpụghewọrọ anyị ihe ndi dị iche iche nke àgwà Ya na ọdịdị Ya. Karia Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Akwụkwọ Nsọ na-egọsi ihe karịrị iri asatọ bu aha Chineke dị iche iche. E nyere ebe a aha isii na ihe ha pụtara iji nyere onye kwere ekwe aka ịbịarụkwu Ọtu Ezi Chineke nso. Ihe odide sitere na Nwee Ahụmahụ Nke Ike Aha Chineke: Nraranye Na-Enye Ndụ , nke Dr. Tony Evans dere. Eugene, OR: Ndị Mbipụta Ụlọ Owuwe Ihe Ubi, 2017.

More

Anyi ga achọ ikele The Urban Alternative na Tony Evans maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na https://tonyevans.org/