E Nyefewo M Chineke Ihe Niile: Ihe Òfùfè Gasị N'eme Mkpali Ndị Nọ Na Mkpọrọ DerèIhe Nhụchatụ

NWÈTÁ MKPALI DỊ MMA GASỊ N'IME IGBE-MBATA ỊMEL GỊ
“Nʼihi na nke a bụ ihe m maarà nke ọma, na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, ma ọ bụ ike ọchịchịrị dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịbịa, ma ọ bụ ịdị elu, ma ọ bụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kèrè ékè, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” - Ndị Rom 8:38-39
Ị̀ nwerè mmasị ịgụ akụkọ gasị na-enye mkpali dị mma nke ọrụ Chineke n'arụ n'ime ụlọ mkpọrọ gasị ma ọ bụ̀ kà esi ebuli ezinụlọ gasị elu site ná njikọ na Oziọma? Debanye aha gị ka ibido natawá ịmel nke Ihe Mkpali anyị n'eme n'usoro, mmelite gasị n'enye agbamume, na ọdịnaya ndị ọzọ dị ukwuu n'ime igbe-mbata ịmel gị.
NWÈTÁ MKPALI DỊ MMA: https://www.prisonfellowship.org/subscribe/
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Akwụkwọ Nsọ bụ̀ akwụkwọ nke mgbapụta, nnwere onwe, na olileanya. N'ime ibe Ya gasị, enwerè ọtụtụ ndị dị iche iche ná akparamá-àgwà ha na obibi ndụ ha ma wee jupụta n'ike— ndị ikom na ndị inyom ndụ tijisìrì ná-achọ́ azịza banyere ngabiga ha na ahụmahụ ha n'ụwa. Ị lee anya, ha dị nnọọ ka ndị nọ na mkpọrọ ugbu a na ndị si na mkpọrọ pụta bụ́ ndị dere ihe òfùfè ndị a i gajè ịgụ. Ọ bụ olileanya anyị na ịga enweta agbamume ma nwee mkpali dị ike na mma site n'olu gasị ndị ụka nọ na mkpọrọ. Ka akaebe ha na nkwupụta ha mee ka anyị niile nwere onwe anyị.
More