Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

E Nyefewo M Chineke Ihe Niile: Ihe Òfùfè Gasị N'eme Mkpali Ndị Nọ Na Mkpọrọ DerèIhe Nhụchatụ

I Surrender: Inspirational Devotions Written by Prisoners

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

ONYE-NWE-ANYỊ HỤRỤ M N'ANYA

“Atụrụ M na-anụ olu M. Amaarà M ha, ha na-esokwa M. Ana M enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka M.” —JỌN 10:27-28

Anà bù m ebi ndụ kà Onye N'eso Ụzọ Kraịst, mana e mecharà m si n'ụzọ eziokwu ahụ pụọ. Ruo ọtụtụ afọ esi m n'otu nsogbu dabà na nsogbu ọzọ, mana marakwá n'ime ime obi m na enyemaka Chineke na nzọpụta Ya dị m mkpa mana m nọ na-alụso eziokwu a ọgụ n'ihi na egwù Chineke n'atụ m. Mana n'agbanyeghị ihe ndị ahụ, otu ihe atụ dị ezigbo mfe chetaarà m na Chineke nọ n'akpọ m òkù n'ụzọ dị nrọ̀ ka m lọghachi na ogige-atụrụ Ya. Agwaghị m ụmụ m maka ọnọdụ m oge m nọ na mkpọrọ. Mgbe ọbụla m kpọrọ ha ma ọ bụ degaará ha akwụkwọ-ozi, ana m asị ha na “anọ m ebe dị anya”, na ihe niile “dị mma.” Mana e mecharà, otu nwaanyị má Chineke bụ́kwá ezigbo enyi m n'ụlọ mkpọrọ gwarà m ka m gwa ụmụ m eziokwu.

Agwarà m ha wee mee nchere ịnụ n'olu ha ruo ọnwa abụọ, nke nchegbu chọrọ ihikpọ obi m. N'ikpeazụ, enwetarà m nnukwu ngọzi—akwụkwọ ozi nke mbụ siteré n'aka nwa m nwaanyị. N'elu peeji akwụkwọ-ozi ahụ, o ji nnukwute mkpụrụ edemede dee, “BIKO DÈTÁRÁ ANYỊ AKWỤKWỌ OZI NGWA NGWA” na “NNE M, AGA M AHUGIDE GỊ N'ANYA RUO MGBE EBIGHỊ EBI.”

Okwu ndị ahụ nwa m nwaanyị detarà m megherè anya m ka hụ eziokwu dị ukwuu: ọ dịghị mgbe Chineke n'adịghị ahụ m n'anya. Ọ bụ ekpere m na m ga-adị ntụkwasị obi nye Ya wee bụrụ ihe ọbụla Ọ chọrọ ka m bụrụ.

—Nina

EKPERE: Ezigbo Onye-nwe-M, biko nyèré m aka ka m bie ndụ Ị chọrọ ka m biri site n'ugbu a gaa n'ihu, nwaayọ nwaayọ kwa ụbọchị kwa oge. Daalụ maka obi ndidi Gị n'ebe m nọ. Nyèré m aka inwekwa obi ndidi n'ebe ndị ọzọ nọ. Amen.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

I Surrender: Inspirational Devotions Written by Prisoners

Akwụkwọ Nsọ bụ̀ akwụkwọ nke mgbapụta, nnwere onwe, na olileanya. N'ime ibe Ya gasị, enwerè ọtụtụ ndị dị iche iche ná akparamá-àgwà ha na obibi ndụ ha ma wee jupụta n'ike— ndị ikom na ndị inyom ndụ tijisìrì ná-achọ́ azịza banyere ngabiga ha na ahụmahụ ha n'ụwa. Ị lee anya, ha dị nnọọ ka ndị nọ na mkpọrọ ugbu a na ndị si na mkpọrọ pụta bụ́ ndị dere ihe òfùfè ndị a i gajè ịgụ. Ọ bụ olileanya anyị na ịga enweta agbamume ma nwee mkpali dị ike na mma site n'olu gasị ndị ụka nọ na mkpọrọ. Ka akaebe ha na nkwupụta ha mee ka anyị niile nwere onwe anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Prison Fellowship maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.prisonfellowship.org/resources/subscribe/