E Nyefewo M Chineke Ihe Niile: Ihe Òfùfè Gasị N'eme Mkpali Ndị Nọ Na Mkpọrọ DerèIhe Nhụchatụ

JIZỌS NỌ EBE A
“Ma ọ sịrị Ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro Gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa Gị nwụọ.’”—LUK 22:33
Pita, n'otu oge na ndụ ya, merè mkpebi siri ike iso Jizọs. Ọ sị dị na ọ gà-agaara Jizọs mkpọrọ ma nwụọ maka Ya. Pita ejighị aghụghọ kwuo okwu a, mana o funahụrụ̀ mkpebi ya mgbe ọnwụnwa na nrụgide bịakwuterè ya! Mana Jizọs kpeerè Pita ekpere, Ọ hapụkwaghị ya.
Ọ̀ bụ̀ nà anyị adagò mbà? Ànyị èsílá n'ebe Onye Nzọpụta anyị nọ kwapụ, gosi Ya azụ anyị, ma gbaa ihe niile ahụ anyị kwerè Ya na nkwa ma meere Ya mkpebi, n'ọkụ? Nwee olileanya. Lekwasị Jizọs anya. Ọ kà nọ ebe a. Ọ kà hụrụ anyị n'anya. O kpeworo anyị ekpere, ma n'agbanyeghị ọdịda anyị niile, Ọ dị njikere ibuli anyị elu, hichaa anyị anya mmiri anyị, na nye obi anyị tiwara etiwa ọgwụgwọ.
Anyị pụrụ ịga n'ihu wee ghọọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ahụ má Chineke, idebe mkpebi gasị na nkwa niile anyị merè nye Jizọs. N'agbanyeghị ebe anyị nọ, ọbụna n'ime ụlọ mkpọrọ gbara itirì, agbanyeghị ọnọdụ anyị gasị, Jizọs nọ ebe ahu. Anyị pụrụ inata agbamume wee ọzọkwa si Ya, “A dị m njikere, Onye-nwe-anyị, iso Gị gaa ụlọ mkpọrọ ma ọbụna n'ọnwụ!”
—Javier
EKPERE: Daalụ, Onye-nwe-anyị, na n'agbanyeghị na anyị darà ọdịda, ọ dịghị mgbe Ị na-ahapụ ma ọ bụ gbanarí anyị. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Akwụkwọ Nsọ bụ̀ akwụkwọ nke mgbapụta, nnwere onwe, na olileanya. N'ime ibe Ya gasị, enwerè ọtụtụ ndị dị iche iche ná akparamá-àgwà ha na obibi ndụ ha ma wee jupụta n'ike— ndị ikom na ndị inyom ndụ tijisìrì ná-achọ́ azịza banyere ngabiga ha na ahụmahụ ha n'ụwa. Ị lee anya, ha dị nnọọ ka ndị nọ na mkpọrọ ugbu a na ndị si na mkpọrọ pụta bụ́ ndị dere ihe òfùfè ndị a i gajè ịgụ. Ọ bụ olileanya anyị na ịga enweta agbamume ma nwee mkpali dị ike na mma site n'olu gasị ndị ụka nọ na mkpọrọ. Ka akaebe ha na nkwupụta ha mee ka anyị niile nwere onwe anyị.
More