Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nsachapụ Mkpụrụ ObiIhe Nhụchatụ

Soul Detox

ỤBỌCHỊ 16 NKE 35

E nwerè ụdị egwù anọ: egwù nke mfụ̀, egwù nke ọdịda, egwù nke njụ, na egwù nke amaghị ihe echi gà ewete. Elee anya, ị n'enwe mgba n'ime otu ma ọ bụ karịa egwù ndị a. Egwù ndị a pụrụ ime ka ahụ gị na obi gị kpọnwụọ, ma wepụ gị anya na obi n'ihe nke Chineke kachasị nma maka gị. Cheta ihe 2 Timoti 1 n'ekwu na Chineke e nyeghị anyị mmụọ nke egwù, kama O nyerè anyị mmụọ nke ike, nke ịhụnanya, na nke ozuzu nke onwe.

Kedụ egwù gasị ị n'enwe mgba na ha ugbu a?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Soul Detox

Anyị abụghị anụ ahụ n'enweghị mkpụrụ obi. Anyị bụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Ebe ndị ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ dị nma ka anyị na-asachapụ anụ ahụ anyị gasị, mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị sachapụ mkpụrụ obi anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri atọ na ise ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na erichasí mkpụrụ obi gị, na ihe na-anọchi gị ụzọ ịbụ ụdị mmadụ Chineke kere gị ka ị bụrụ. Ị ga-amụta site n'Okwu Chineke otú ị ga-esi mee ka ihe nrichasí ndị a dị́ adịghị irè ọzọ na makuo obibi ndụ dị ucha maka mkpụrụ obi gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church