Ụzọ Chineke Isi Rúté Ihe Ịga Nke ỌmaIhe Nhụchatụ

Ọ dịghị onye na-akwado ime ihe wee buru n'obi na ya gà-ada. Ma ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịlaghachi azụ ma mezie mmejọ nke afọ anyị gara aga, anyị nwerè nhọrọ nke inwe ihe ịga nke ọma site na ebe a gaa n'ihu. Anyị nwerè ike ịmalite ma ọ bụ gaa n'ihu nà njem nke imezu akara aka Chineke maka anyị.
Chineke nà-enye anyị ihe nzuzo nke ibi ndụ nke ihe ịga nke ọma n’Abụ Ọma 25:14. Ịmara ọgbụgba ndụ Chineke bụ ịmara ihu ọma na ngọzi Ya. Ọgbụgba ndụ Ya nwerè njikọ chiri-anya na nkpuchi Ya. Dozie onwe gị n'okpuru ọchịchị ọgbụgba ndụ nke Chineke ná ndụ ma ị gà-enweta ihe ịga nke ọma nke ime mmụọ.
Mana amaokwu a nwerè ọnọdụ atapanyerè ya: Ị gà-ama ọgbụgba ndụ Chineke naanị site n'ịtụ egwù Ya. Enwerè ọnọdụ ihe nkpata na nsonaazụ maka inwe ọganihu nke ime mmụọ. Ọ bụ maka ihe ị nà-eme gbasara nsọpụrụ na nkwanye-ùgwù ị na-egosi Chineke na okwu Ya. Nke a gà-emetụta ọkwa nke ịga nke ọma nke mmụọ gị ozugbo. Ị pụghị ịhapụ ịsọpụrụ Chineke ná mkpebi gị ma na-atụ anya inweta ọkwa ọ bụla nke ịga nke ọma n'alaeze Ya. Ihe ịga nke ọma nà-amalite nà nkwanye ùgwù na nrubeisi.
Olee akụkụ ndụ gị ebe ị na-anaghị egosi ezi egwù Chineke?
Gịnị ka iso Chineke nwee ọgbụgba ndụ pụtara?
Ọ bụ olileanya anyị na atụmatụ ihe ọgụgụ a gbarà gị ume. Mụtakwuo ihe banyere Tony Evans na Kingdom Men Rising ebe a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye ọ bụla nà-achọ ihe ịga nke ọma, ma ọtụtụ ndị amaghị ka ha gà-esi achọta ya n'ihi na ihe ha na-achụ bụ nghọta ụgha nke ihe ọ pụtara ibi ndụ na-aga nke ọma. Iji nweta ezi ihe ịga nke ọma, ịkwesịrị ilekwasị anya na nkọwa Chineke nke ihe ọ pụtara. Ka onye na-ede akwụkwọ ama ama Tony Evans gosi gị ụzọ ị gà-esi rute ezi ihe ịga nke ọma nke alaeze Chineke na òtù i gà-esi achọta ya.
More