Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụzọ Chineke Isi Rúté Ihe Ịga Nke ỌmaIhe Nhụchatụ

God’s Path to Success

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

A bịa na mpaghara nke ime mmụọ, a na-achọta ihe ịga nke ọma n’imezù nzube Chineke maka ndụ gị. Nke ahụ bụ nkọwa Akwụkwọ Nsọ maka ọganihu. N'omenala anyị taa, e nwerè ọtụtụ nkọwa n'ezighi ezi nke ihe ịga nke ọma pụtara. Ụfọdụ ndị na-echè na ihe ịga nke ọma na-ejikọta na ego ole i nwerè. Ndị ọzọ na-ahuta ya ka nrịgo elu i meworo n'ọkwa ọrụ gị. Ụbọchị ndị a enwerè ike ịkọwa ya dịka mmadụ ole n'eme gị nsonyere n'ebe mgbasa-ozi-ọha. Ma nsogbu dị́ n’echiche ndị a nile bụ̀ na ha adabereghị n’ụkpụrụ nke ihe ịga nke ọma nke Chineke.

Jizọs nyerè anyị nkọwa nke ihe ịga nke ọma mgbe O kwuru, sị, “Enyere M Gị otuto n’elu ụwa, ebe M rụchara ọrụ ahụ nke Ị nyeworo M ka M rụọ.” (Jọn 17:4).

Pọl kwuru otú ihe ahụ n'ụzọ dị iche mgbe ọ sịrị na "Agbasiwo m ngba ọma ahu, agbasiwo m ọsọ ahu, edebesiwo m okwukwe ahụ." (2 Timoti 4:7).

N’ezie, Chineke gwara Jọshụa na ihe ịga nke ọma ya dabeerè kpam kpam n’iji nlezianya tụgharịa uche n’Okwu Chineke tinyeré ime ka mkpebi ya na omume ya kwekọọ n’okpuru Ya (Joshua 1:8). Ihe ịga nke ọma gụnyerè imezu ihe Chineke kpọrọ gị ime.

Gịnị bụ nkọwa nke onwe gị banyere ihe ịga nke ọma?

Olee otú o si jírí tụnyere nkọwa nke Chineke?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God’s Path to Success

Onye ọ bụla nà-achọ ihe ịga nke ọma, ma ọtụtụ ndị amaghị ka ha gà-esi achọta ya n'ihi na ihe ha na-achụ bụ nghọta ụgha nke ihe ọ pụtara ibi ndụ na-aga nke ọma. Iji nweta ezi ihe ịga nke ọma, ịkwesịrị ilekwasị anya na nkọwa Chineke nke ihe ọ pụtara. Ka onye na-ede akwụkwọ ama ama Tony Evans gosi gị ụzọ ị gà-esi rute ezi ihe ịga nke ọma nke alaeze Chineke na òtù i gà-esi achọta ya.

More

Anyị nacho ikele The Urban Alternative (Tony Evans) maka ịnye anyị atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa: https://tonyevans.org/