Ụzọ Chineke Isi Rúté Ihe Ịga Nke ỌmaIhe Nhụchatụ

Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ahụta ọganihu ka ọ dị n'ezie. Ha na-achọ ihe ọkụ ọkụ, ihe n'egbuke egbuke na otu nnukwu ịkụrụ ha aka n'ada ụda n'ama egwuregwu. Ụlọ ọrụ ndị na-arụpụta ihe ntụrụndụ na ebe mgbasa-ozi-ọha gasị, tinyere egwuregwu ndị ọkachamara, emepụtawo echiche n'ezighị ezi banyere ihe ọ pụtara ịbụ onye na-eme nke ọma. N'ụzọ dị mwute, atụmanya a n'enweghị ezi uche na-emekarị ka anyị ghara inwe ezi ihe ịga nke ọma ma ọ bịa. Ma ọ bụ ọ na-eme ka anyị ghara ịnụ ụtọ ihe ịga nke ọma anyị nwetaworị. N'ihi na anyị aghọtaghị ya, anyị nwerè ike ịmalite ịchụso ihe ọzọ dị nnukwu n'anya anyị. Na nke ọzọ, na nke ọzọ. Anyị na-ahụ onwe anyị ka anyị n'agba ọsọ ka òké nke ihe ndụ n'enye nsogbu.
Ebe anyị bi n’ụwa tiwara etiwa, nke mmehie na mmetụta ya metọworo, ọtụtụ n’ime ihe ndị dị ịrịba ama nke ihe ịga nke ọma ná ndụ anyị pụrụ iyi ihe na-ewute nà atọghí oké ụtọ mgbe ọgwụgwụ ihe niile bịara. Ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ụdị ihe ịga nke ọma nke ime mmụọ, anyị nwerè ike ịmalite ime ọchịchọ na-adịghị agwụ agwụ maka ihe enyeworị anyị. Ma anyị enweghị nghọta doro anya banyere ihe ịga nke ọma pụtara na alaeze Chineke, anyị agaghị ama otú esi etinye oge, nkà na akụ anyị iji mee ihe maka Ya. Ihe ọ bụla ị kụrụ gà-ekpebi ihe ị gà-aghọrọ. Ma Ekwensu na-emekarị ka anyị n'agha mkpụrụ n’ime ihe ndị na-ezighị ezi n’ihi na anyị aghọtaghị otú ihe ịga nke ọma n’ezie yirì.
Olee ihe atọ kachasị elu ma ọ bụ ebumnuche ị ghaworò mkpụrụ n'ime ha afọ ole na ole gara aga?
Kedụ mkpuru nke ihe ndị a mipụtarà? Hà dabanyerè n'ụkpụrụ nke alaeze Chineke?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye ọ bụla nà-achọ ihe ịga nke ọma, ma ọtụtụ ndị amaghị ka ha gà-esi achọta ya n'ihi na ihe ha na-achụ bụ nghọta ụgha nke ihe ọ pụtara ibi ndụ na-aga nke ọma. Iji nweta ezi ihe ịga nke ọma, ịkwesịrị ilekwasị anya na nkọwa Chineke nke ihe ọ pụtara. Ka onye na-ede akwụkwọ ama ama Tony Evans gosi gị ụzọ ị gà-esi rute ezi ihe ịga nke ọma nke alaeze Chineke na òtù i gà-esi achọta ya.
More