Ntụgharị Si N'ebe Nri-Ahụ Nọ PụọIhe Nhụchatụ

Mgbe i kwerè ka Mmụọ Nsọ jiri eziokwu nke Okwu Chineke na-achị echiche gị, ị ga-adị ndụ nnwere onwe. Dị ka Jizọs kwuru, “unu gà-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ gà-emekwa ka unu nwere onwe unu” (Jọn 8:32). Okwu ahụ bụ́ “mara” karịrị nanị ịmata ihe. Ọ pụtara inwe obi ike nke ukwuu n'enweghị obi abụọ ọbụla. Ị “mà na ị maarà” na ọ bụ eziokwu. Ọ bụ eziokwu n'ekwu okwu n'ime ime nke onye ị bụ̀. Nke ahụ bụ ihe ịmara eziokwu na ịbụ onye a tọhapụrụ n'agbụ pụtarà.
Ụdị “ịmara” nke Jizọs na-ekwu maka ya nke gá-emé ka ị nwere onwe gị bụ ịmara na ịmaarà n’ezie. Ọ bụghị iche uche banyere ya. Ọ bụghị inwe olileanya. Ọ bụghị nwale, kama ọ bụ n'ịmaarà na ị mà n'ihi na ị gosipụtara ya dịka eziokwu.
Mana site n’Okwu Chineke, ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-enweta ihe àmà a nke ana-apụghị ịgbagha agbagha nke dị n’ihu okwukwe iji wepụta ọrụ eziokwu. Nke a merè okwukwe n’Okwu Chineke ji bụrụ ihe bụ isi ma dị oke mkpa maka usoro nke imeri omume ọbụla na-eri ahụ. Ị gà-ebu ụzọ kwere na Okwu Chineke bụ eziokwu, wee tinye Okwu Ya n'ọnọdụ gị dị ka eziokwu ka O we tụgharịa ma rụọ ọrụ ntọhapụ Ya na ndụ gị. Eziokwu nke Okwu Ya na-enyere gị aka imeri ihe ndị jidesiri gị ike, mana Ọ ga-arụ ọrụ a naanị mgbe ị na-ewere Ya dịka eziokwu. Ị gà-ahazirịrị uche gị, omume gị, obi gị, ako gị, n'Okwu Ya wee debe ha n'okpuru iwu nke Okwu Ya na ọchịchị Ya gbasara ọnọdụ ma ọ bụ usoro echiche ọbụla ị na-eche ihu ka Ọ dị ike tọhapụ gị n'agbụ.
Gịnị ka ị maarà n’Okwu Chineke nke ga-enyere gị aka inweta nnwere onwe pụọ n’ihe nri-ahụ?
Ọ bụ olileanya anyị na atụmatụ ihe ọgụgụ a gbara gị ume. Maka ozi ndị ọzọ gbasara Ime Ntụgharị Na Ndụ Gị, pịa ebe a.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mgbe ndụ gị adịghị nkwekọ́ n'Okwu Chineke, ị gà-enwetarirí nsonaazụ na-egbu mgbu. Ọtụtụ mmadụ enwewo nsogbu ahụ́ ike, nsogbu n'ọrụ ha, ma mmekọrịta ha ewee funahụ ha, ha wee chọpụta na ha nọ ebe dị anya n’ebe Chineke nọ n’ihi ihe nri-ahụ. Ọbụna nri-ahụ siri ike dị ka ịñụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịlele ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ihe nri-ahụ dị nta dị ka iri oke nri ma ọ bụ ibi ndụ kà efulefù, ihe nri-ahụ na-akpaghasị ndụ anyị. Kwe ka ọkachasị-mara onye edemede Tony Evans gosi gị ụzọ inwere onwe gị.
More