Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntụgharị Si N'ebe Nri-Ahụ Nọ PụọIhe Nhụchatụ

A U-Turn From Addiction

ỤBỌCHỊ 2 NKE 3

Otu n'ime ihe mere ndị mmadụ ji anọgide na nri-ahụ bụ n'ihi na ha na-adabere na usoro echiche ha nke bụ ụgha. Nnukwu ụgha nke n'akwado nri-ahụ bụ na ị nwere ike iji anụ ahụ dozie anụ ahụ. Mana Pọl na-agwa anyị na 2 Ndị Kọrịnt 10; anyị adịghị alụ agha n'ụzọ anụ ahụ. Anụ ahụ enweghị ike idozi anụ ahụ. Ee, ị nwere ike ịgbalị ijikwa ya, nke ahụ nwerè ike ịrụ ọrụ nwa oge. Mana ị nweghị ike iji anụ ahụ nke mmehie dozie nsogbu mmehie inye ya ọgwụgwọ. Ihe ị ga-emerịrị bụ ibu ụzọ gaa n’eziokwu nke Okwu Chineke. Ọ bụ eziokwu Ya gà-eme ka ị nwere onwe gị. Ọ bu ezi-okwu-Ya gà-egbuwapú mmehie ma weta ndụ. Eziokwu Ya na-ekpughe okwu ụgha ahụ e ji kee gị n'ime nkpagbu nke nhụjuanya nke mere ka i rapagidesí ike na mmehie gị na nsonaazụ ya.

Iji aka gị achọ ịwepụ onwe gị n'agbụ nke mmehie dịka ebe nne nne na-achọ iji bọọdụ nsacha we sachapụ uwe. Ọ ga-ewe ọtụtụ ụbọchị iji mee ya, ma n'agbanyeghị nke ahụ, uwe ahụ agaghị adịcha ọcha, ike gà-agwụkwa nne nne gị maka mbọ ya niile. Ọ gà-enwe ahụ mgbu, na nkụda mmụọ. Chineke ewepụtala ihe ngwọta maka nmehie anyị site na nsacha nzọpụta nke sitere n'aka Ọkpara Ya. Àjà Jizọs na-enye anyị ohere inweta ike nke Mmụọ Nsọ n'ime anyị. Mmụọ ahụ na-enyere anyị aka ịghọta na ịnata eziokwu (Jọn 16:7–11). Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka ime ihe Jizọs gwarà anyị ka anyị mee na Jọn 8, nke bụ́ “nọgide nụ̀ n’Okwu M”. Okwu a "nogide" pụtara itapagidesi ike, irapara—ịnọ chịm. Ị ghaghị ịnọgidesì ike n'eziokwu ahụ, ọ bụghị ịnọtú gị gbapụ. 

Olee otú mgbalị anụ ahụ́ gị siworo na-aga nke ọma maka imeri ihe nri-ahụ gị? Kedụ ụzọ ka mma?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

A U-Turn From Addiction

Mgbe ndụ gị adịghị nkwekọ́ n'Okwu Chineke, ị gà-enwetarirí nsonaazụ na-egbu mgbu. Ọtụtụ mmadụ enwewo nsogbu ahụ́ ike, nsogbu n'ọrụ ha, ma mmekọrịta ha ewee funahụ ha, ha wee chọpụta na ha nọ ebe dị anya n’ebe Chineke nọ n’ihi ihe nri-ahụ. Ọbụna nri-ahụ siri ike dị ka ịñụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịlele ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ihe nri-ahụ dị nta dị ka iri oke nri ma ọ bụ ibi ndụ kà efulefù, ihe nri-ahụ na-akpaghasị ndụ anyị. Kwe ka ọkachasị-mara onye edemede Tony Evans gosi gị ụzọ inwere onwe gị.

More

Anyị n'ekele The Urban Alternative (Tony Evans) maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://tonyevans.org/