Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ntụgharị Si N'ebe Nri-Ahụ Nọ PụọIhe Nhụchatụ

A U-Turn From Addiction

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

Ọtụtụ n’ime ụmụ Chineke abụrụla ndị a dọtara n'agha n'ime mmụọ. Ha tọrọ̀ atọ́ n'ime okirikiri mmehie nke ha n'enwebeghị ike imebi. Ọbụna iṅụbigà mmanya ókè, ịhụ ihe onwunwe n’anya, obi ilu, anyaụfụ, iribigà ihe ókè, ikwa arịrị n'obi, ​​ikiri ihe ndị n'agba ọtọ, ịṅụ ọgwụ ike, ịgba chaa chaa, ikwu okwu rụrụ arụ, itapara n'ebe mgbasa-ozi-ọha oge niile, ikwu okwu ndị na-adịghị mma nke onwe, inwe ọnụmà, ma ọ bụ iwe iwe—nri-ahụ nke uche ma ọ bụ nke ọgwụ ọjọọ na-akpachi ọtụtụ mmadụ taa. 

Okwu Akwụkwọ Nsọ maka ihe anyị n'akpọ nri-ahụ bụ njide-siri-ike. Ihe nri-ahụ, ma ọ bụ kpọọ ya njide-siri-ike-nke-mmụọ, bụ usoro echiche n'adịghị mma na omume gasị gbanyere mkpọrọgwụ n'ime uche anyị. Anyị kwenyerè ma na-arụ ọrụ dị ka aga-asị na ọnọdụ anyị enweghị mgbanwe, n'agbanyeghị na ụdị àgwà na omume ahụ megiderè uche Chineke. Mmehie nà-aghọ onye-ndú-ohu nke na-achị echiche anyị, mkpebi, na omume anyị. 

Nzọụkwụ mbụ iji gbanwee nri-ahụ bụ anyị ịchọsike ka a tọhapụ anyị. Jizọs n'ebu ụzọ jụọ ndị mmadụ ma hà chọrọ ka ahụ dị ha mma (Jọn 5:6). Ọ bụrụ na mmadụ arapara ma chọọ itapasi ike n'ihe ọjọọ, o nweghị ihe onye ọzọ nwere ike ime iji mee ka ọ na-aga n'ụzọ ziri ezi. Nnwere-onwe pụọ na omume nri-ahụ gà-esi n'ime malite. Ọ bụrụ na gị ahu onwe gị n'ọnyà site n'ihe iri-ahụ ma ọ bụ usoro echiche na-adịghị mma, o nwere ike ịdị gị ka agwọ agbachiela onwe ya n'uche gị. 

Oge eruwo ịhọrọ ụzọ ọhụrụ maka nnwere-onwe. Nnwere-onwe na-amalite site n'ịhọrọ ịpụ n'ụzọ ị nọ n'ime ya ugbu a wee gaa n'ụzọ dị iche. 

Ị̀ dị njikere n'ezie isi n'ime ihe nri-ahụ n'enye gị nsogbu pụta ma kwe ka Jizọs tọhapụ gị n'agbụ?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

A U-Turn From Addiction

Mgbe ndụ gị adịghị nkwekọ́ n'Okwu Chineke, ị gà-enwetarirí nsonaazụ na-egbu mgbu. Ọtụtụ mmadụ enwewo nsogbu ahụ́ ike, nsogbu n'ọrụ ha, ma mmekọrịta ha ewee funahụ ha, ha wee chọpụta na ha nọ ebe dị anya n’ebe Chineke nọ n’ihi ihe nri-ahụ. Ọbụna nri-ahụ siri ike dị ka ịñụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịlele ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ihe nri-ahụ dị nta dị ka iri oke nri ma ọ bụ ibi ndụ kà efulefù, ihe nri-ahụ na-akpaghasị ndụ anyị. Kwe ka ọkachasị-mara onye edemede Tony Evans gosi gị ụzọ inwere onwe gị.

More

Anyị n'ekele The Urban Alternative (Tony Evans) maka inye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://tonyevans.org/