Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Ọ Bịara N'etiti Abalị Doró Anya
Mgbe eluigwe na ụwa ọhụrụ ga-enwe Onye-Isi-Udo, Eze ha.
Na ụwa dum ana-ezighachikwa abụ nke ugbu a ndị mmụọ ozi na-abụ.
Mgbe mbụ ndị mmụọ ozi ahụ bụrụ abụ banyere udo n’ụwa na ihe ọma nye mmadụ nile, ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ aghaghị ịnọ n'eche ihe na-emenụ. N'ezie ha adịghị anụ ukwe ndị mmụọ ozi kwa ụbọchị, ma Palestine n'oge narị afọ mbụ abụghị ebe udo dị. Okporo ámá jupụtara na okwu nke mgbanwe ọchịchịrị ma esemokwu n'esité n'ụdị okwu a n'emekarị ka mgwepịa na ntigbu n'eme. E kewara ọha mmadụ n'usoro nke okike, agbụrụ, akụ na ụba, na okpukperechi. Ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ n’onwe ha bụ naanị ihe obere ka ha jiri kara ndị arịrịọ na ubibi eji hazie okwá ụmụ mmadụ na ọha. Nye ụfọdụ n’ime anyị, Ekeresimesi n’onwe ya bụ oge iso ndị enyi na ndị ezinụlọ anyị na-anọrị, mana nye ndị ọzọ, ọ na-echetara ha na ha nọ nanị ha ma ọ bụ na ekewapụrụ ha n’ebe ndị ha hụrụ n’anya nọ. Puku afọ abụọ ka e mesịrị, o yiri kà “eluigwe ịdị adị n’elu ụwa” ka dị ezigbo anya n'ebe anyị nọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ bí n'oge narị afọ mbụ ahụ nọ n'atụ anya ka edozie nsogbu nke ụwa ngwa ngwa, ma n'ezie nke ahụ emeghị. Ọ kà emebeghị. Mana Ekeresimesi na-echetara anyị nkwa Chineke kwere iweta alaeze ebe agha, ikpe n'ezighị ezi, na ọbụna ọnwụ ga-abụ ihe ochie, na ebe anyị na Chineke ga-ebikọ ọnụ. Nke ahụ bụ olileanya anyị. Chineke nwere atụmatụ n'ezie banyere nke a na anyị. Nke kacha mma n'ezie n'abịa.
Ka ọ dị ugbu a, Chineke n'aga n’ihu n'egosi anyị ịhụnanya Ya n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị. Ọ na-aza ekpere anyị. Ọ na-akpọ anyị òkù ka anyị malite ibi ndụ taa dị ka ụmụ amaala nke alaeze ahụ a na-ekpughebeghị nke ọma. Anyị nwere ike ịhụrịta ibe anyị n'anya dị ka Kraịst hụrụ anyị n'anya, ebe a na ugbu a. Anyị nwere ike igosi ọmịiko Ya na ịhụnanya Ya n'enweghị atụ nye ndị ọzọ taa. Anyị nwere ike ịhụ ihe atụ na ụtọ nke Eluigwe na ụwa ọhụrụ ahụ ugbu a. Anyị nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ ahụmahụ ahụ. Anyị pụkwara ime ihe a nile n’ịmara na Alaeze Chineke ga-enwe mmeri nakwa na otu ụbọchị ihe nile e kere eke ga-ahụ eziokwu ahụ ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ nụrụ n’ebe dịpụrụ adịpụ, n’akụkụ ugwu Palestine.
Ajụjụ:
Kedụ otu ihe ị nwere ike ịgbanwe iji nye ndị gbara gị gburugburu ihe atụ na ụtọ nke Alaeze udo nke Chineke?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church